"Anyị ahụbeghi nwanne m nwoke na ndị enyi ya gara agbamakwụkwọ na Mbano kamgbe ụbọchị atọ"

 Alaefula Chimuru, Madu Promise na Victor Chibuike

Ebe foto si, Other

Mgbe e biputara ya

Ndị ezinaụlọ Madu nke Imo steeti nọ na gbagharịa dịka ha na-achọ nwanne ha nwoke na ndị enyi ya abụọ gara agbamakwụkwọ na Mbano achọ.

Fortune Madu bụ nwanne nwoke Promise Madu bụ onye a na-achọ achọ gwara BBC Igbo sị na nwanne ya na ndị enyi ya bụ Alefula Chimuru na Victor Chibuike bụ ndị a na-achọ achọ kamgbe Sọnde bụ ụbọchị iri abụọ na asatọ nke ọnwa Ọgọstụ 2022.

O kwuru sị, “ Nwanne m si Owerri gawa agbamakwụkwọ n’Isiala Mbanọ n’ụbọchị Sọnde”.

“Na ihe dịka elekere asatọ nke abalị ka ọ kpọrọ n’ekwe ntị were gwa onye ọ nọ na nke ya na ọ nọ n’ụzọ alọta” dika Fortune siri kwuo.

Ọgara n’ihu kwuo, “ mgbe onye ọ nọ na nke ya chere ya ruo elekere iri nke abalị ma ọ hụghị ya, o bidoro kpọwa ya n’ekwe ntị mana ọ zaghị>

A kpọrọ ya na Whatsapp ma zịgakwara ya ozi na soshal midia ya; ọ zaghị kwa”.

Madu kwuru na a na-achọkwa ụgbọala 'Lexus' ha ji mee njem ahụ achọ.

Dịka o siri dị Fortune Madu kwuru na ha agaala kpesara ndị uweojii nke steeti ahụ maka ihe mere nụ.

BBC Igbo kpọtụrụ ọnụ na-ekwuchitere ndị uweojii Imo steeti bụ Mike Abattam n’ekwe ntị maka ihe mere mana ọ zaghị.

Cheta na nso nso a n'ọnwa Julaị afọ 2022 ka e gburu ndị ntoroọbịa ruru asaa nke obodo Awo-Omamma dị n'Oru West Imo Steeti.

Akụkọ sị na ndị a sikwa agbamakwụkwọ na-alọta mgbe ha zutere ọnwụ.

E boro ndị ọrụ nchekwa Ebubeagu ebubo ịkpa arụ a mana gọọmentị Imo sị na ọ bụ ndị nchekwa DSS mere ya ma sị na ndị e gburu bụ ndị ekperima na-enye nsogbu n'obodo.