Ihe onyonyo maka ụlọelu 'Plaza' dara n'Abuja

Maka ụlọ dara n'Abuja
Mgbe e biputara ya

Ndị bi na mpaghara Kubwa nke nọ n'isi obodo Naijirịa bụ Abuja nọ n'uju dịka ụlọ ahịa nke dị n'Aso Savings dara.

Aha onyonyo, Ihe onyonyo maka ụlọ dara na Kubwa dị n'Abuja

Dịka o siri dị, naanị otu onye nwụrụla na ya bụ ọdachi ebe a ka na-achọ otu onye ọzọ achọ.

Mmadụ ise ọzọ bụ ndị eburula gawa ụloọgwụ.

Onye hụrụ ka ya bụ ihe mere kwuru na ọ bụ n'ihe dịka elekere iri na otu nke abali ka ya bụ ihe mere.

Otu onye na-achọghị ka a kpọọ aha ya kwuru na ọ bụ iji nwa ọrụ adịgboroja ya na imegharị usoro esiri see ya bụ ụlọ butere ọdịda ya.

Dịka o siri dị, ndị ọrụ gbatagbata nke gụnyere ndị FRSC, NEMA na NSCDC auchiela ebe ahụ ma na-arụ ọrụ ha.