Etu Ifeanyi Alumona siri tụrụ ugo dịka onyeisi ojii mbụ ritere ntụrụugo AFS

Aha onyonyo, Akụkọ a bụ maka etu Ifeanyi Alumona siri tụrụugo dịka onyeisi ojii mbụ ritere ntụrụugo AFS
Etu Ifeanyi Alumona siri tụrụ ugo dịka onyeisi ojii mbụ ritere ntụrụugo AFS
Ifeanyị Alumona

Ebe foto si, Ifeanyị Alumona

Mgbe e biputara ya

Ifeanyị Alumona bụ onyeisiojii mbụ ritere ntụrụugo nke AFS Award for Young Global Citizens.

Alumona bụ onye Afrika mbụ ritere nke a kamgbe afọ 1914.

Alụmona onye Enugwu steeti nke dị na mpaghara ọwụwa anyanwụ Naijirịa kwuru na ọ bụ nkata ya na onye bụbu onyeisiala mba Amerịka bụ Barak Obama kpara gbara ya ume o jiri jisie ike n'ọeụ.

Ọ na-agba mbọ ịkwụsị mkpagbu na mmegide a na-emegide ụmụ nwaanyị ọkachasị na Naijirịa.

Ọ bụ site na ụlọọrụ 'Boys Champion' nke o bidoro n'afọ 2018 ka o ji agbasa ozi a.

Ya bụ ụlọọrụ na-akụzịrị ụmụokorobịa mkpa ọ dị ịchekwa ụmụnwaanyị.

Boys Champion na-ekuzikwara ha etu ha kwesịrị isi sopụrụ ụmụnwaanyị.

Nke a bụ akụko ya nke o ji ọnụ ya kọọrọ BBC Igbo.

Ifeanyị Alumona mgbe o ritere ntụrụugo AFS

Ebe foto si, Ifeanyi Alumona