You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
Eji m anya m hụụ ọnwụ m mana Chineke zọrọ m ndụ - Ohakim
Ikedi Ohakim bụbu gọvanọ Imo steeti akọwaala etu o si gbanahụ ọnwụ n’aka ndị ojiegbe wakporo ya na Mọnde ụbọchị abụọ nke Jenụwarị, 2023.
Ohakim bụ onye gwara ndị ntaakụkọ Punch na Vanguard okwu sị na o chere na ọ nwụchaala na mwakpo ahụ.
“Ha sị n’azụ wakpoo ụgbọala anyị na-agba anyị egbe. Echeere m na m anwụọla, mụ na ụmụ m abụọ nọ - nwoke na nwaanyị.
Ihe zọro m bụ na ụgbọala m bụ mgbọ atụ ‘bullet proof’. Na m dị ndụ taa bụ maka amara Chineke nakwa ụgbọala m bụ ‘bullet proof’.
“Mana ihe na-ewute m bụ na ha gbagburu ndị ọrụ m mmadụ anọ gụnyere ọkwọụgbọala, kedụ ihe ọjọọ m mere?”
Ohakim kwuru na ndị kpara arụọ bụ ndị a zụrụ ọfụma na ha bịara ka ha gbuo ya, ọ sị na etu ndị a si eme karịrị okwu ‘Indigenous People of Biafra (IPOB).’
Etu o si mee
Nke a mere mgbe bu Ohakim na ụmụ ya abụọ si ozi na-alọta ma rutere n’obodo Oriagu dị n’okpuruọchịchị Ehime Mbano, Imo Steeti na mgbede Mọnde.
Ndị ojiegbe a ji ụgbọala ha ma chọrọ ịgbachi ụgbọala nke Ohakim ihu mana ọkwọụgbọala ya jisiri ike gbanarị ndị a.
Ndị a tụziri ogbunigwe n’ụgbọala bu ndị uweojii na-eche Ohakim nche ma gbaa ya ọkụ nke mere ndị uweojii anọ n’ime ha nwụrụ.
Otu onye ntaakụkọ anyị kpọrọ Ohakim mana ike okwu adịghị n’ihi ihe ọ gabigara n’aka ndị a.
Mana otu onye enyemaka pụrụiche ya bụ Emmanuel Chukwu gwara BBC Igbo n'ekwentị na ihe a mere n'ezie.
"Ohakim na ụmụ ya abụọ (otu nwoke na otu nwaanyị) nọ n'ime ụgbọala mgbe ihe a mere."
"Ha si nleta ha gara na-alọta ma rute ebe a kpọrọ Oriagu dị n'etiti Isiala Mbano na Ehime Mbano mgbe ndị ojiegbe a wakporo ụgbọala ha".
Chukwu gara n'ihu kwuo na ha amabeghi kpọmkwem ndị mere mwakpo a, na ọ na-ewute ha etu ndị uweojii anọ si nwụọ n'ihi nke a.
Mgbe BBC Igbo kpọtụụrụ ọnụ na-ekwuru ndị uweojii Imo Steeti bụ Michael Abattam mana ọ zabeghi tupu akụkọ a na-apụta.
End of Mgbe ndị ojiegbe wakporo Ifeanyi Uba
Kamgbe ihe dịka afọ atọ gara aga ka ọnọdụ nchekwa malitere ịdị ọjọọ na mpaghara Ọwụwa Anyanwụ nke Naịjirịa.
Kamgbe ahụ rute ugbua ndị ojiegbe awakpoola ọtụtụ ndị ndọrọ ndọrọ ọchịchị, ndị gbapụtara ihe, ndị ọrụ nchekwa nakwa ndị nkịtị.
Ụfọdụ n'ime ha bụ ndị ha na-atọrọ ma gbuo ebe ụfọdụ na-agbanahụ ọnwụ n'otu ntabi anya dịka nke Ohakim a.