Athan Achonu emeriela ntụliaka imeụlọ otu Labour Party nke ọkwa Gọvanọ Imo Steeti

Ebe foto si, Nneji Athan Achonu/Facebook
Onye omeiwu Athan Achonu emeriela dịka onye ga-eji ọkọlọtọ Labour Party zọọ ọkwa onyeisiala Naịjirịa dịka ọ meriri ntụliaka ime ụlọ nke otu ahụ.
Cheta na a ga-eme ya bụ ntụliaka nke ọkwa gọvanọ Imo Steeti n'ụbọchị 11 nke ọnwa Nọvemba afọ 2023.
Achonu na-anọchite anya okpuruọchịchị Imo Nọt n'afọ 2015.
Ọ bụ onye meriri ntuliaka gọvanọ Abia Steeti bụ Alex Otti bụ onyeisioche ntuliaka ime ụlọ Imo Steeti kpopụtara Achonu dịka onye meriri ntuliaka imeụlọ a dịka ọ bụ ya kacha nwee vootu.
Otti kwuru na Achonu nwetara vootu 134 ebe onye nke na-eso ya n'azụ nwetara vootu 121.
Labour Party: Agbaso, Achonu, Ogunewe na ndị ọzọ chọrọ iji ọkọlọtọ a zọọ ọkwa gọvanọ Imo steeti

Ebe foto si, Facebook
'Labour Party' abụrụla nwaanyị ọma ọtụtụ ụmụ okorobịa na-abịara, dịka ọtụtụ ndị ndọrọndọrọ ọchịchị na-agbabanye n'oto ahụ iji mara ma ha a ga-azọta ọkwa.
Na ntuliaka ọkwa gọvanọ a ga-enwe n'Imo Steeti n'ọnwa Nọvemba afọ a, mmadụ 12 ekwupụtala mmasị ha ma gbata akwụkwọ iso zọọ ntuliaka imeụlọ ndị LP nke a ga-enwe n'ụbọchị 15 nke ọnwa Eprel 2023.
Ha dịbu mmadụ 13 gbatara akwụkwọ ndị LP mana otu n'ime ha bụ Humphrey Anumudu nwụrụ na ntumadi n'izuụka gara aga.
Lee ndị niile na-azọ ọkwa
Martin Agbaso

Ebe foto si, Martin Agbaso/Facebook
- Ọ dị afọ 64
- Ọ bụ onye Emekuku, Owere, Imo Steeti
- O nwere ọzụzụ na ngalaba akụnụba (Economics) na mahadum New York na mba Amerịka
- Ọ bụ onye ojiego achị ego a ma ama
- O meriri ntuliaka ịnọchite mpaghara Imo East n'ụlọ sineti Naịjirịa n'afọ 1992, n'otu Democratic Pati nke Naịjirịa (DPN), tupu ndị agha eweghara ọchịchị n'afọ 1993
- Ọ rụrụ ọrụ dịka onye ndụmọdụ onyeisiala Olusegun Obasanjo n'okwu gbasara 'ecology'
- Ọ zọbuola ọkwa gọvanọ Imo steeti na pati 'All Progressives Grand Alliance (Apga) n'afọ 2007
- Ọ bụkwa onyeisi pati Apga na Naịjirịa malite na 2017 ruo 2018
Athan Achonu

Ebe foto si, Athan Achonu/Facebook
- Ọ bụ onye Etiti na mpaghara Okigwe n'Imo steeti
- Ọ gụrụ akwụkwọ na mahadum John Cabot na Rome, Italy
- Ihe ọtụtụ ndị mmadụ ji mara ya bụ 'one-arm general', o kwuru na ọ bụ ogbunigwe (grenade) merụrụ ya ahụ n'oge agha Biafra
- Ọ zọburu ma merie ọkwa ịnọchite anya mpaghara Imo North n'ụlọ sineti Naịjirịa n'afọ
Lincoln Ogunewe

Ebe foto si, Lincoln Ogunewe/Facebook
- Ọ bụbu onye ọchịagha n'otu ndị agha Naịjirịa tupu ọ laa ezumike nka
- Ọ rụrụ ọrụ dịka onyeisi nhazi atụmatụ, nke a kpọrọ 'Chief of Policy and Plans', n'otu ndị agha Naịjirịa
- Ọ bụ onye Ezinihitte Mbaise
- Ọ rụkwara ọrụ dịka onye ndụmọdụ n'okwu nchekwa maka otu mba ụwa (National Defense Adviser, United Nations)
Ike C. Ibeh

Ebe foto si, Ike C Ibe/Facebook
- Nne na nna ya bụ ndị Obowu, mana a mụrụ ya n'obodo Emekuku, Owere.
- Ọ bụ ọkaiwu; o nwetara ọzụzụ na mahadum Imo Steeti tupu ọ bụrụ mahadu Abia steeti
- O nwere nzere 'bacherlors' na 'masters' na mmụta ọkaiwu
- Ọ onye omeiwu n'ụlọ omeiwu Imo steeti, mechaa bụrụ onyeisi ụlọ omeiwu ahụ
- O mechara bụrụ onye nnọchite anya Imo steeti na mba Amerịka n'okwu gbasara nzụkọrịta ahịa
- Ọ zọbuola ọkwa gọvanọ Imo steeti na 2007 nakwa 2011
Tobechukwu Justice Ehirim

Ebe foto si, Umuaka Times
- Ọ bụ onye Umuaka, n'okpuru ọchịchị Njaba n'Imo Steeti
- Ọ nwetara ọzụzụ na ngalaba mmepụta ọgwụ (pharmacy) na mahadum nke Naịjirịa, Nsukka
- O nwekwara nzere PhD nke si na mahadum Witwatersrand, na mba Saụt Afrịka
Charles Onyirimba

Ebe foto si, Charles Onyirimba/Facebook
- Ọ bụ onye Umueze n'Ehime Mbano
- Ọ bụ onye ọkaiwu
- O nwetara nzere 'masters' nakwa PhD na mahadum Oklahoma nakwa Florida nke mba Amerịka
- Ọ zọbuola ọkwa ịnọchite anya mpaghara Imo North n'ụlọ omeiwu ukwu nke Naịjiria na pati Apga
David Mbamara

Ebe foto si, Cpt Dr David Mbamara/Facebook
- Ọ bụ onye Ikeduru n'Imo Steeti
- David Chukwuemeka Mbamara nọbu n'otu ndị agha Naịjirịa ebe o ruru n'ọkwa 'Captain' tupu ọ laa ezumike
- O nwekara nzere PhD, ma hibekwa ụlọọrụ na-ahụ maka nchekwa
- Ọ zọbuola ọkwa gọvanọ Imo Steet n'otu Social Democratic Party (SDP)
Kelechi Nwagwu
- Ọ bubu onyeisiụlọ omeiwu Imo Steeti
- Ọ bụ onye Ikeduru
Charles Agomuo
- Ọ bụbu onye ọkwa ya gbalitere n'otu ndị uweojii Naịjirịa
- O ruru n'ọkwa osote onyeisi ndị uweojii (Assistant Inspector General) tupu ọ laa ezumike
Basil Maduka

Ebe foto si, Basil Maduka
- Ọ bụ onye Ezinihitte Mbaise
- Ọ bụ onye o ji ego achụ ego a ma ama
- Ọ zọbuola ọkwa ịnọchite anya mpaghara Imo East
- Ọ nọbu na pati PDP
Ikechukwu Joseph Ukaegbu

Ebe foto si, Chief Ikechukwu Ukaegbu/Facebook
- Ikechukwu Joseph Ukaegbu bụ ya zọrọ ọkwa gọvanọ Imo Steeti na Labour Party n'afọ 2019 mana o merighi
- Ọ bụkwa onye Ikeduru Imo Steeti
Chinedu Amadi
Humphrey Anumudu (larala mmụo)
Ego ole ka e ji agbata 'ticket' ndị LP?
Tupu taa bụ Wenezde, onye ọbụla chọrọ ịgbata akwụkwọ ikike iso zọọ ọkwa gọvanọ Imo steeti na LP, ga-akwụ nde naịra 25 iji gbara ya bụ akwụkwọ.
Mana n'ọgbakọ ndị isi LP mere n'Abuja n'ụbọchị Tuzde ka ha nọrọ kpebie ibutu ọnụ ego 'ticket' ha ka ọ bụrụzie nde naịra 15.
Peter Obi bụ onye zọrọ ọkwa Onyeisiala Naịjirịa na Labour Party wepụtara ozi ma kwuo na ọ bụ ya nyere ndị isi pati ahụ ndụmọdụ ka ha chegharịa echiche ma butuo ego ole ha na-ana maka 'ticket' ọkwa gọvanọ ha.




























