Ọ bụ mgbere ka ejiri kpọbata m mba Briten - Mo Farah

Mo Farah

Ebe foto si, Getty Images

Mgbe e biputara ya

Ọkaịbe n’ịgba ọsọ tere aka asọmpị Olimpik bụ Mo Farah apụtala kwuo na-akpọpụrụ ya dịka nwata site na mba Djibouti kpọga ya mba Briten mgbe ọ dị naanị afọ itoolu.

O kwuru na ezigbo aha ya bụ Hussein Abdi Kahin ma na-akọwa na ọbụghị onye mba Sọmalịa.

Ọ kwuru na ọ bụ otu nwaanyị ọ na-amaghị kpọpụrụ ya ka ọ nyere ụmụaka ndị ya na ha bi aka.

O kwuru sị, “ Ọtụtụ mgbe ka m na-achọ ịwepụ obi m na ya, kama dịka oge na-abịa ị gaghịzị enwe ike ime ya”.

Ọ gwara BBC na Red Bull Studios na ọ bụghị onye mba Sọmalịa ma sị na nne na nna ya na ụmụ nne ya nwoke abụọ abịatubeghị mba Briten mbụ.

 

Mo Farah

Mo kwuru na nna ya nwụrụ mgbe mgbọ egbe tụrụ ya mgbe ọ dị naanị afọ anọ.

O kwuru na nwanyị ahụ ọ na amaghị gwara ya na ọ na-aga Yurop ka ya na ụmụnna ya ndị ọzọ biri.

O kwuru sị, “Obi dị m ụtọ n’ihi na abatubeghị m ụgbọleu mbụ”.

Mo kwuru na nwaanyị ahụ gbanwere aha ya ma nye ya akwụkwọ njem etinyere foto ya kama ahọ nọ ebe ahụ bụ “Mohammed Farah”.

O kwuru sị, “ mgbe anyị rur otu ụlọ dị na Hounslow, nwaanyị naara m mpempe akwụkwọ edere etu m ga-esi achọta ndị ezinụlọ were dọọkaa ya n’ihu m. Mgbe ahụ ka m mara na m nọ na nsogbu”.

Mo kwuru na o bidoro ọrụ dịka onye na-edozi ụlọ ma na elekọta ụmụaka.

O kwuru sị, “ ọtụtụmgbe ka m na-akpọchị onwe m n’ụlọ mposi ebe akwa”.

Mo kwuru na afọ ole maole gara tupu ha ekwe ya bido akwụkwọ.

A gwara ndị ụlọakwụkwọ na Mo bụ onye gbara ọsọ ndụ gbata mba Briten.

Onye nkuzi megharịahụ Mo bụ Allan Watkinson kwuru na Mo na-egosi na ọ bụ ọkaibe n’egwuregwu ịọgba ọsọ na megharịahụ.

Mo mechara gwa Watkinson eziokwu maka aha ya na-ebe o siri bịa.

Mo Farah

Ezigbo Mo apụtala ihe

Onyekuzi Watkinson kpọrọ ndị ụlọọrụ gọọmentị na-ahụ maka ụmụaka bụ ndị nyere aka kpọga Mo ka o bịrị n’ụlọ ezinụlọ sị mba Somali.

Mo kwuru sị,” Ahụ ezinụlọ m na-eme m kama kamgbe mụ na ndị ezinụlọ Somali ahụ biwere, ihe niile bịara dịwazie mma”.

Ọ bụ mgbe Mo dị afọ 14 ka o bidoro gosiwa na ọ mara agba ọsọ nke ọma.

Watkinson nyere ya aka tinye akwụkwọ ịbụ onye mba Briten nke ọ nwetara n’ọnwa Julaị afọ 2020.

Mo Farah na-egosi akwụkwọ adigboroja ejiri kpọfete ya Briten

Ịgba ọsọ zọrọ mụ ndụ

Mo kwuru na ọ na-akọ akụkọ a iji mee ka ndị mmadụ chegharịa etu ha si eche uhce maọbụ ahụta ịgba ohu na ịgba mgbere mmadụ.

Mo kwuru sị, “ Amaghị m na e nwere ọtụtụ ndị mmadụ ba-agabịga ihe m gabigara. Nke a na-egosi na ọ bụ ihu ọma m zọrọ m”.

“N’ezia, ihe zọrọ m bụ na m ma etu esi agba ọsọ”.

BBC kpọtụrụ nwaanyị ahụị kpọtara Mo Briten kama o kwuneghị okwu ọbụla.