Etu m si nyapụ tanka na-agba ọkụ iji zọọ ndị mmadụ - Ejiro Otarigho

Ebe foto si, Others
"Otebeghi aka mụ na ndị otu m kwuputechara ihe mgbaama a mere n'ụlọụka m", ka Ejiro Otarigho bụ ọkwọụgbọala tanka nọ na agba ọkụ a hụrụ na soshal midia kwuru ka ụbọchị ole na ole ọ zọrọ ndị mmadụ n'ihe gaara abụ oke ọdachi gachara.
Na ya bụ ihe onyonyo fesara na soshal midia, Otarigho nyarala ya bụ tanka si n'ebe ọtụtụ ndị mmadụ bi na mpaghara obodo Agbarho dị n'okpuruọchịchị Ughelli Nọt, nyaga ya ebe ọ gaghị enye oke nsogbu ma ọ bụrụ na ọ chọrọ ịgbapụ nnukwu ọkụ - ebe ụlọ maọbụ ahịa adịghị.
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post, 1
Nke ka nke bụ na enweghi onye nọ na tanka ahụ nwụrụ maọbụ merụọ ahụ dịka ọ na-agba ọkụ.
Otarigho bụ onye ka gbachara nkwụ nwaanyị nso nso a gwara BBC na "ọ bụ n'obodo a ka m bi, anyị kelere Chukwu n'ihi nsogbu a ọ wepụrụ na ndụ anyị."
Ejiro kọwara etu ihe si mee

Ebe foto si, Ejiro Otarigho
"Ya bụ nsogbu mere ebe elekere asaa nke mgbede n'ụbọchị 10 nke ọnwa Juun, 2022.
"Anọ m na-anya tanka bu mmanụ ụgbọala, ebutuola m ụfọdụ mmanụ ma si n'ebe m gara ibutu ụfọdụ na-apụta mgbe nwa bọyị m tiri mkpu sị 'Ọga, lekwa ọkụ'.
"Ọtụtụ mmadụ bi na mpaghara ahụ. Mgbe m hụrụ na ọ bụ nnukwu ọkụ na-agba, m gwa nwa bọyị m sị ya rituo ka naanị m hụwa ihe dị na ya.
"Mgbe ọ rituru, anyara m tanka ahụ ihe ruru nkeji 15 site n'ebe ọ malitere ịgba ọkụ ruo ebe na-enweghị ụlọ dị ya dịkwa nso ọdọmmiri.
"Ebumnobi m bụ ịnyabanye tanka ahụ n'ime mmiri, mana m ruru ebe ahụ hụ na e busara ọtụtụ ụgbọala ebe ahụ. M gwa onwe m sị na m nyara ụgbọala a n'ogologo ụzọ, tanka a nwere ike ịda ma gbapụo nke ga-ebutekwa nnukwu nsogbu ọzọ.
"Ya mere m ji nyara ya gaa n'ebe na-enweghi ihe dị ya nso."
Ejiro kwuru na nwunye ya dị ime ọnwa itoolu eruola iritu ugbua, ma kwuo na o meela naanị ọnwa anọ ha gbara nkwụ nwaanyị.
Ọtụtụ ndị Naịjiria ajaala Ejiro ike maka obi ọ kara nke zọrọ ndụ ndị mmadụ
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post, 2

End of X post, 3
Gọvanọ Ifeanyi Okowa kelere ịka obi Ejiro
Gọvanọ Ifeanyi Okowa nke Delta steeti ekeleela Ejiro Otarigho n'ihi etu o si kaa obi mee ihe o mere.
O kwuru na ya bụ agwa ọ kpara gbochiri ihe gaara abụ nnukwu ọdachi.
N'ozi o si n'aka ọnụ na-ekwuru ya bụ Olisa Ifeajika ziputa, Okowa kwuru sị "Anyị ji gị anya isi, anyị chọkwaranụ ka ndị Delta na ndị Naịjiria mụta ma mekarịa gị n'ụdịrị agwa dike a ị kpara, n'ihe niile ha na-eme."