Afọ ole ka nwata kwesịrị iru tupu e nyewe ya ọgwụ ụkwara?

Akụkọ dị icheiche apụtala n'ọdị nso a na mba ụwa dị icheiche gbasara etu ahụike ụmụaka si kawanye njọ dịka ha ṅụchara ọgwụ ụkwara.
N'ụbọchị 15 nke ọnwa Disemba ka otu nwata dị afọ abụọ na ọkara kwụsịrị iku ume n'obodo Mumbai na mba India dịka e nyere ya ọkwụ ụkwara.
Tilottama Mangeshkar bụ nne ochie nwata ahụ, bụrụkwa dọkịnta, gwara BBC na ọ bụ nne nwata ahụ nyere ya ọgwụ dịka ọ na-akwa ụkwara, o teghizi aka, nwata ahụ adaa jụụ, kwụsị ịmegharị ahụ.
"Oge nne ya bịara kpọọ mụ n'imeụlọ, m gbara pụta hụ na ụcha nwata ahụ agbanweela, ọ naghị eku ume, m wee malite inye ya CPR, tupu anyị were ọsọ gbaga ụlọọgwụ," Dọkịta Mangeshkar kwuru.
"Dịka nkeji 17 gachara, nwata ahụ nwetakwara onwe ya, malite iku ume."
"Anyị mere nnyoch wee chọpụta na ọgwụ ụkwara ahụ e nyere ya nwere akụrụngwa a na-akpọ Chlorpheniramine na Dextromethorphan.
"Na mba Amerịka, akụrụngwa a bụ ihe a machiri amachi itinye ya n'ọgwụ ụmụntakịrị na-erubeghị afọ anọ ga-aṅụ."
Dọkịta Mangeshkar kwuru na ndị mepụtara ọgwụ ahụ edeghị n'ahụ ya na ụmụ ntakịrị na-erubeghị afọ anọ ekwesịghị ịṅụ ya bụ ọgwụ.
Ụkwara ụmụaka abụghị ihe ọjọọ - Ndị dọkịta

Ebe foto si, Getty Images
Ugbua, i nwereike inweta akụkọ BBC Igbo niile n'ekwenti gị.
Pịa aka ebe a ka i soro anyị
Ebe Ọkwa azụmahịa WhatsApp kwụsịrị
Dọkịta Mukesh Aggarwal bụ ọkachamara n'ahụike ụmụaka n'ụlọọgwụ KEM na Mumbai, gwara BBC na tupu nwata eruo afọ ise, akụrụngwa na-ebuso nje agha n'ahụ mmadụ a na-akpọ 'immunity', esichabeghị ike n'ahụ nwata ahụ.
Ya mere ọ bụghị ihe ịgba gharịị na nwata ahụ na-ebute nje nwereike ị na-akpatara ya ụkwara.
"Mana ọtụtụ n'ime ha, ya bụ ụkwara anaghị anọkarị abalị atọ maọbụ anọ, o were aka ya laara onwe ya," Dọkịta Aggarwal kwuru.
"Ọ bụrụ na nje a nọtee aka karịa, e nwereike inye nwata ahụ ọgwụ antibiotics, mana ewepụ nke a, ụdị nje ndị ahụ na-alara onwe ha, ọ dịghị mkpa inye nwata ọgwụ ụkwara."
Ndị dọkịta na-ekwu na ụkwara dị mma maka ụmụaka, maka na ọ na-enyere ha aka iwepụ ihe ndị na-adịghị mma n'ime ahụ ha.
Ụkwara ụmụaka kwesịrị iji aka ya kwụsị n'ụbọchị olemole, mana ọ bụrụ na ọ kwụsịghị, nne na nna nwata kwesịrị ịga hụ dọkịnta.
Nnyocha nke ngalaba ahụike mba India mere gosiri na nwatakịrị nwereike ịkwa ụkwara ihe karịrị ugboro 11 n'ụbọchị.
Ọnụọgụgụ a nwereike ịgbali elu n'oge nnukwu oyi na-atụ.
Mperi dị n'inye nwata ọgwụ ụkwara

Ebe foto si, WHO
Dọkịnta Aggarwal kwuru na ọgwụ nwereike ime ka nwata na-arahụ ụra karaịa etu o kwesịrị. Lee nkọwa ndị ọzọ o nyere:
- "Mgbe nke a mere, ọ bụrụ na e nwere ihe tọrọ n'akpịrị ya, ihe ahụ agaghị enweike ịpụta n'ihi na nwata ahụ ga na-arahụ ụra."
- "Ịṅụ ọgwụ ụkwara na-ebutekwara ụmụntakịrị ọbara mgbatu ala (low blood pressure).
- Ọgwụ ụkwara nwereike ibutere nwata nhịahụ n'iku ume dịka azụzụ nwereike ime
- Onwekwara ike iwetu ikuku ndụ (oxygen) dị n'ahụ nwata
N'ọdị nso a, na mba Gambia, ụmụaka karịrị 60 nwụrụ n'ihi ọgwụ ụkwara ha ṅụrụ nke e si mba India mepụta.
Ọ bụ eziokwu na gọọmentị mba India na-ekwu na ọgwụ nke ụmụaka ahụ ṅụrụ bụ nke adigboroja, ọ bụghị nke esi mba ha bubata na Gambia.
Mana otu 'World Health Organisation' adọọla aka na ntị ka ndị mmadụ zeere ọgwụ ndị ahụ.
Ihe ị ga-eme ma nwata na-akwa ụkwara?
Ọ dị mfe ịzụta ọgwụ ụkwara na ọgwụ azụzụ n'ụlọahịa ebe ọbụla a na-ere ọgwụ, mana ọ dịghị mma inye ya nwata ọbụla na-agafebeghị afọ abụọ.
Ụkwara maọbụ azụzụ abụghị ihe nwereike igbu nwatakịrị.
Ngwalaba na-ahụ maka nri na ọgwụ, a na-akpọ Food and Drug Administration Agency (FDA) na mba Amerịka kwuru na onweghị enyemaka ọbụla pụrụ iche ọgwụ na-enyere ha n'ọnọdụ ahụ. Ihe i nwereike ime bụ:
- Inye nwata ahụ mmiri ọkụ maka akpịrị ya
- Ịtụnye ya ụdị mmiri pụrụiche a na-akpọ 'saline nose drops' n'imi ka imi ya ghara ịkpọchi
- Weta akụrụngwa a na-akpọ 'humidifier' iji mee ka ikuku nwata na-ekuru ghara ịkpọ nkụ. 'Humidifier' kwesịrị ịbụ nke jụrụ oyi, ọ bụghị nke dị ọkụ
- Nwee akụrụngwa a na-akpọ 'bulb syringe' maka ụmụaka na-erubeghị otu afọ. Ọ bụ ihe eji ewepụ ihe na-apụta ụmụaka n'imi
Ndị dọkịnta na-adọ aka na ntị ka a ghara inye ụmụaka ihe dịka mmanụ aṅụ, ginger maọbụ lemon.




























