Ịgba ọtọ kpee ekpere, gịnị ka ọ pụtara n'ala Igbo?

Ebe foto si, Screenshot
Na nso nso a, akụkọ pụtara na otu nwoke na-eme ejije na Nollywood ọkachasị na ngalaba ndị nke ala Yoruba bụ Ebun Oloyede pụtara gbara ọtọ kpere Bola Tinubu na-azọrọ APC ọkwa onyeisiala ekpere ngọzị dịka mmụọ ya siri gwaa ya.
N’ihe onyonyo o zipụtara ebe ọ na-ekpe ekpere a, Oloyede gba ọtọ biko n’isi ya ruo n’ụkwụ ya ma nọrọ n’akụkụ mmiri, nwere olu ike na-ekpere Tinubu ekpere ngọzị.
Nke a mere ọtụtụ ji na-ajụ, ma ịgba ọtọ kpee ekpere mmadụ ekpere, ọ dị ire? Ndị mma maka omenala Igbo nakwa ihe gbasara okpukperechi tinyere ọnụ n’okwu kọwara BBC Igbo nke bụ nke.
Maazị Mcginger Ibenema onye dịbịa Bekee nakwa onye ọkachamara na ihe gbasara omenala Igbo kwuru na enweghị nnukwu ihe ịgba ọtọ pụtara n’ala Igbo n’oge gara aga.
End of Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị

Ebe foto si, Reuters
Ọ kọwara na mmadụ niile na-agba ọtọ aghagharị n’oge gara aga ma kọwa na n’ebe afọ 1960 onye ọchịchị nke mpaghara Enugu ochie bụ Michael Okpara tiri iwu gbochiri ndị mmadụ Igba ọtọ bịa ahịa zụta ihe.
O kwuru “Iyi uwe bụ ihe ọhụrụ, ọ bụ ndị mba ndị chiri anyị n’oge ochie wepụtara echiche ọhụrụ nye anyị”
Agbenyeghị nke a, o kwuru “A bịa n’omenala Igbo nakwa ihe gbasara okpukperechi anyị, ọ bụ naanị ndị nne nwaanyị nakwa otu ụmụnwaayị bụ ndị na-agbakarị ọtọ kpere mmadụ ekpere, maọbụ gọrọ mmadụ ọfọ, ọkachasị iji gosi iwe ha megide mmadụ”
“Ekpere Igbo na-ahụta dịka ihe ga-adị ezigbo ire bụ mmadụ ịpụta n’ihu ahịa kpee ekpere, n’ụzọ gbara atọ, maọbụ anọ maọbụkwanụ n’akụkụ mmiri”

Ugbua, i nwereike inweta akụkọ BBC Igbo niile n'ekwenti gị.
Pịa aka ebe a ka i soro anyị
Ebe Ọkwa azụmahịa WhatsApp kwụsịrị
Maazị Ibeneme kwuru na ndị na-agba ọtọ ekpe ekpere echieche amụtara amụta mana o kwughi hoo haa na ya bụ atụmatụ anaghị adị ire.
Otu Maazị ọzọ bụkwa onye ọkaibe n’okwu omenala bụ Ramas Okoye gwara BBC Igbo na ịgba ọtọ kpee ekpere dị ezigbo ire. O kwuru na omenala Igbo nakwa okpukperechi Igbo nabatara nke a.
N’okwu ya, Maazị Okoye sị “Ekpere a na-akacha adị ire n’etiti abalị maọbụkwanụ n’ụzọ ụtụtụ”
O kwuru na ọtọ bụ ihe dị nsọ, nke mere na onye ọbụla ga-ekpe ụdịrị ekpere ga-abụ onye aka ya dị ọcha ma bụrụ onye na-emerụghị ala n’ụzọ ọbụla.
Ọ gara n’ihu kwuo na ndị mmadụ na-eme nke a iji gosi ala nakwa chi ha na ha pụtara ikpe ekpere ahụ etu ha siri bịa ụwa na-ebughi ihe ọzọ n’obi.
Okoye kwukwara “Ọ bụ mgbe e megidere mmadụ ihe mmenyụọ ya anya ka onye ahụ na-enwe ike ekpe ụdịrị ekpere nye chi ya, iji gwaa ya na ya bụ okwu apụọla n’egwu.”
O sị “Mana mmadụ nwekwaraike ibanye n’ime ụlọ ya, n’obi ya gbara ọtọ kpere onye ọzọ ekpere ngọzị. Nke a bụ ihe e ji obi ọcha ekpe”
“Ndị mmadụ nwereike ịgba ọtọ kpere onye ha hụrụ n’ezigbo anya ekpere ngọzị dịka mgbe ha na-eme njem.”
N’oge gara aga, a hụọla ọtụtụ mgbe ebe otu ụmụnwaanyị na-atọhapụ akwa ha gbara ọtọ gosi iwe ha mana




























