Akwapụrụ m n'ụlọ nna m maka egwu, mana agaghị agwa gị mee ya - Kolaboy

Aha onyonyo, Akwapụrụ m n'ụlọ nna m maka egwu, mana agaghị agwa gị mee ya - Kolaboy
Akwapụrụ m n'ụlọ nna m maka egwu, mana agaghị agwa gị mee ya - Kolaboy
Mgbe e biputara ya

Otiegwu Nwodo Chinonso a maara dịka Kolaboy akọwaala etu o si malite iti egwu nakwa ihe mere o ji hapụ ụlọ nne na nna ya maka egwu.

Na mkparịtaụka ya na BBC News nwere, Kolaboy kwuru etu njem ya dịka onye na-eme egwu si malite, ihe ụfọdụ cheere ya aka mgba nakwa ụfọdụ ihe o chere banyere etu ndị Igbo si ahụta ma na-akwado ndị na-eti egwu

"E nwere otu ụbọchị m si n'ụlọụka pụọ ga-eme ihe egwu freestyle. Oge m mechara ya lọta, ebe niile nwuuru ọkụ. Gịnị mere m ji hapụ ụlọ gawa ime ihe egwu? N'ụtụtụ na-esote ụbọchị ahụ, ebuuru m ngwongwo niile gawa nne na nna na m pụọ," ka Kolaboy kwuru.

Ọ gara n'ihu gbaa n'anwụ etu ọpụpụ ya n'ụlọ nne na nna ya si mee ka ọ malite ịgbasi mbọ ike iji bụrụ mmadụ.

N'okwu ya "Ọ bụ oge ahụ m pụrụ ka m malitere ị na-emesi ihe egwu ike maka na enweghịzi m nne na nna ga-agwa m emela nke a maọbụ nke ọzọ. Mana otu ihe m ma nke bụ ihe m ga-akwa ndị na-eto eto bụ, e jila maka na adị m Isi ike oge ahụ ga mee ihe m mere maka na mụ onwe mere nwere ihe ndị bekee kpọrọ self-awareness."

Nwaamdị ahụ bụ onye Ugbawka dị na okpuru ọchịchị Nkanu East n'Enugwu st

Kolaboy kwuru na ọ gụrụ akwụkwọ na mahadum Institute of Management and Technology (IMT) Enugwu.