Agaghị m echefu nkwado Cubana Chiefpriest nyere egwu m - Boypee

Aha onyonyo, Agaghị m echefu nkwado Cubana Chiefpriest nyere egwu m - Boypee
Agaghị m echefu nkwado Cubana Chiefpriest nyere egwu m - Boypee
    • Onye dere ya, Michael Ngene na Donald Wogu
    • Ndị mere akụkọ a, Journalist na Video Journalist
  • Mgbe e biputara ya

Otiegwu Sopuru Precious Odunze e ji Boypee mara, agbaala n'anwụ etu njem ya dịka otiegwu si malite oge ọ nọ n'ụlọakwụkwọ Sekọndrị.

"Egwu mbụ m tiri bụ mụ na mmadụ 11 ọzọ tiri ya oge anyị nọ n'ụlọakwụkwọ Sekọndrị", ka Boypee gwara.

Na mkparịtaụka ya na BBC News nwere, Boypee gwara anyị na nna ya akwadoghị ya iti egwu ma kọwaa etu nna ya si eti ya oge ọbụla ọ gara tie egwu ma lọta n'ụlọ.

O kwuru na n'agbanyeghị ihe ndị a, o kpebiri na ya agaghị akwụsị iti egwu maka na egwu bụ otu ihe ọ hụrụ n'anya karịsịa.

Boypee mere ka o doo anya na ego mbụ o nweter site n'iti egwu bụ nna ya ka o nyere ego.

"Ụbọchị ahụ a kwụrụ ụgwọ mbụ m nwetere n'egwu, enyere m ya nna m, nna m etighị m ihe ụbọchị ahụ".

Nke a bụ ihe Boypee kwuru na o mere ya ka o kpebie ịmalite ị na-enweta ego n'egwu.

Nwamadị ahụ bụ onye Orlu dị n'Imo steeti gwara anyị ka o si zute Cubana Chiefpriest ma kwuo na nzute ha abụọ gbanwere ndụ ya ma mee ya ihe ọ bụ taa.

"Nke bụ eziokwu bụ na Cubana Chiefpriest bụ onye Chukwu ji gbanwee ndụ m", ka o kwuru.

Boypee kwuru etu ya na Brown Joel na Hyce si zute ma gụọ egwu a kpọrọ 'Ogechi' wuru ebe niile nakwa etu Cubana Chiefpriest siri nye aka mee ha Davido soro ha mee egwu ọzọ nke bekee kpọrọ remix.

Banyere ndị chọrọ iti egwu ma dịrị ka ya, Boypee gwara ndị dị etu a ka ha mara na ọ bụghị naanị ịma etu e si agụ egwu bụ isiokwu, o kwuru na ọ dịkwa mkpa ịma mmadụ.

O kọwara na onye ọbụla chọrọ iti ehwu taa, kwesịrị ịkwado ọfụma ma ghara ịda mba.