Etu ndị uweojii si gbuo ndị e chere bụ ndị ntọrị mmadụ n'Abia Steeti

Egbe
Nkọwa foto, Foto a bụ nke e tinyere iji kọwaa akụkọ
Mgbe e biputara ya

Mmadụ anọ e chere bụ ndị ntọrị mmadụ zutere ọnwụ ha dịka ha na ndị uweojii Abia Steeti kwakọtara mgbọ n'ụbọchị Sọnde, ụbọchị 18 nke Disemba 2022.

Akụkọ kwuru na ndị uweojii wakporo ogige ndị ekperima ahụ dị na mpaghara Osisioma, bụ ebe ha na-esi akpa ike na mpaghara dị icheiche n'Abia Steeti nakwa Rivers Steeti.

Ụfọdụ ndị uweoji na-achọghị ka a kpọọ aha ha n'ihi na ha enweghị ikike ịgwa ndị ntaakụkọ okwu, gwara onye ntaakụkọ anyị na ọ bụ ama ka a gbaara ha mere ha ji wakpo ogige ndị ekperima ahụ.

Ndị uweojii zọpụtara ụmụ nwaanyị abụọ ndị ntọ ahụ jichiri n'ogige ha ma na-akpọ ndị ezinụlọ ha ka ha kwụọ ụgwọ iji gbapụta ha.

Ọtụtụ egbe gụnyere AK47, egbe 'pump action' nakwa ụgbọala abụọ ka ndị uweojii chọtara n'ogige ndị ekperima ahụ.

Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii Abia Steeti kwuru na ya bụ ihe mere mana ha na-eche ka e mechaa nnyocha tupu ha ezipụ ozi.

Ndị uweojii Abia jichiri ndị ekperima iri na Sepụtemba

Ndị a na-eche bụ ndị ekperima

Cheta na ndị uweojii Abia steeti, n'ọnwa Julaị afọ a, gosiri ọha obodo mmadụ iri ndị ojiegbe ezu ohi bụ ndị ha nwụchiri maka ịwakpo ụgbọala e ji ebu ego (bullion van) na mpaghara dị icheiche na steeti ahụ nakwa n'imo steeti.

Dịka Janet Agbede, bụbu Kọmishọna ndị uweojii Abia steeti n'oge ahụ si kwuo, ụmụ okorobịa iri ahụ bụ ndị wakporo ụgbọala 'bullion van' ego juru n'ime ya n'ụbọchị 26 nke ọnwa Julaị, n'okporoụzọ Enugwu-Pọtakọtụ.

Otu n'ime ndị ohi ahụ bụbu onye ọrụ DSS a chụrụ n'ọrụ aha ya bụ Prosper Israel, onye ya na nwanne ya nwaoke nke ọ tọrọ so n'otu ndị ekperima.

Ngwaọgụ ndị uweojii hụrụ n'aka ndị ekperima a gụnyere: otu nnukwu egbe a na-akpọ 'General Purpose Machine Gun'; egbe AK47 iri na atọ; otu egbe double barrel; ogbunigwe IED; ọtụtụ mgbọ egbe, otu ụgbọala mercedes, na ego karịrị nde naịra iri.

Ngwaọgụ ndị uweojii natara ndị ohi
Ngwaọgụ ndị uweojii natara ndị ohi