Etu ndị mmadụ si zute ọnwụ ha n'emume ‘Christ The King’ n’ụlọụka CKC dị n'Aba, Abia Steeti

Ebe foto si, Screen shot
Ụka Katọlik nke Dayọsis Aba, Abia Steeti akwaala arịrị maka ọnwụ ndị otu bụ ndị nwụrụ n’oge emume ‘Christ The King’ nke ugboro 34 n’ụbọchị Sọnde 24th Nọvemba, 2024.
Ozi si n’ụka Bishọp Dayọsis ahụ nke Augustine Ndubueze Echema tinyere aka na ya kwuru na ndị a nwụrụ n’oge a na-eme ngagharị n’ihe nnukwu igwe mmadụ gbakọtara ọnụ.
Ụlọụka a gara n’ihu kwuo na a ka na-eme nnyocha iji mata kpọmkwem ndị a nwụrụ nakwa ihe butere ọnwụ ha. Mana ha e kwubeghi kpọmkwem mmadụ ole nwụrụ maọbụ merụrụ ahụ.
Ha gakwara n’ihu tie ezinaụlọ ndị nwụrụ anwụ na ndị ọzọ merụrụ ahụ aka n’obi, ma kwee nkwa ịkwadọ ha n’oge ihe mwute a.
Etu ihe a si mee?
Akụkọ kwuru na ọdachi a mere mgbe ọtụtụ igwe mmadụ gbakọtara n’ụlọụka Katọlik CKC a ma ama dị n’Aba iji mee emume ngagharịiwe ‘Christ The King Procession a kpọrọ ‘Corpus Christi’ nke a na-emekwa na mbaụwa niile.
N’ihi oke okpomọkụ na ọtụtụ igwe mmadụ gbakọtara ọnụ n’otu ebe, ụfọdụ ndị mmadụ bidoro ikubi ume n’ihi ike ọgwụgwụ na nzọgbu ụkwụ.
E buuru ndị a gawa n’ụlọọgwụ, ụfọdụ n’ime ha nwụrụ ebe ndị ọzọ merụrụ ahụ ma na-anata ọgwụgwọ ugbua.
Ndị a nwụrụ gụnyere agadi nwaanyị abụọ - nwụrụ n’ihi ike ọgwụgwụ, otu nwagbọghọ na otu nwata nwoke bụ ndị nwụrụ n’ihi nzọgbu.
‘Nke a abụghị mbụ ụdịrị ihe a na-eme’

Ebe foto si, Screen shot
Otu onye hụrụ ka ihe si mee nyere aha ya ka Chinenye gwara BBC na “igwe mmadụ bịara ebe ahụ ka nkụ, nke bụ na ọ na-ara ndị mmadụ ahụ iku ume.
Nke a abụghị mbụ ndị mmadụ na-ekubi ume n’emume a mana ọ bụ mbụ m na-anụ na mmadụ nwụrụ.
Nnukwu anwụ dị ọkụ nọ na-acha n’ụbọchị ahụ, e nwere ndị na-ekwesighi ịbịa emume a dịka ndị okenye, ụmụaka nakwa ndị nne dị ime maọbụ kuu nwa n’aka.
Ụka Katọlik Aba kwesịrị ịchọ ụzọ belata ọnụọgụgụ ndị na-abịa emume a.
“Ọ bụru na ndị Parish niile ga-apịachi emume ha n’ụlọụka ha dị iche iche ma ghara ịbịa n’isi ụlọụka Cathederal.
Otu onye ọzọ a kpọro Ebere kwuru na ihe mere e jiri zọgbuo ndị mmadụ bụ mgbe ụfọdụ ndị bịara na CKC ma malite ife ego n’elu.
“Dịka ndị mmadụ na-achọ ịtụtụ ego, a malitere ịzọ onwe ha ụkwụ nke butere ọnwụ ndị ahụ a zọgburu azọgbu.




























