You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
Ihe mere a tọhapụbeghi ozu Ifeanyi Slami a gbagburu agbagbu- Uweojii Anambra
Ndị uweojii Anambra Steeti ekwuola na ha atọhapụbeghi ozu Ifeanyi Slami bụ onye a gbagburu n'Awka n'izuụka gara aga.
Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii bụ Tochukwu Ikenga sị na ọ dịghị n'aka onye DPO ịtọhapụ ozu ya maọbụ inyocha ihe banyere ogbugbu mmadụ.
Ọ sị na e burula okwu ahụ gawa n'aka ngalaba ndị uweojii pụrụiche a kpọrọ CID maka ime nyocha tara ọchịchị.
Ikenga gara n'ihu kwuo na e gburu nwamadị a oge ndị e cheere bụ ndị otu nzuzo na-agbarịta onwe ha egbe n'ụbọchị 26 Nọvemba, 2022.
Ọ kwukwara na ha anwụchiela mmadụ atọ bụ ndị ga-azara ọnụ ha maka ọnwụ nwamadị a.
End of Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị
Ikenga gwakwara BBC Igbo n'ekwentị na ebubo ahụ otu nwamadị a kpọrọ @Princenechecfr boro ndị uweojii nke sị na ha jichiri ozu Slami ma gbochie ezinaụlọ ya iburu ya bụ asị.
Ọ sị na ha ji ohere a akpọku nwamadị a ka ọ bịa n'ụlọorụ bịa kọwaa ebe ndị uweojii gwara ezinaụlọ Slami kwụọ puku narị atọ na puku iri ise (N350,000) tupu ha atọhapụ ozu ya.
N'okwu ya “Anyi akpọkuola ya bụ nwaamadị ka ọ bịa gozi anyị ihe akaebe n’ebubo a ọ bọrọ”
Nwaamadị bụ @Princenechecfr mechara zịpụta ozi n’ụbọchị mbụ nke ọnwa Dịsemba na-ekeele ndị uweojii Naịjirịa n’Anambra maka ịtọhapụ ozu nwaamadị ahụ.
Ikenga gwara BBC Igbo na ihe akaebe dị nke ọ ga-ezipụta gosiri na enyefeela ezinaụlọ Slami ozu ya dịka ha mechara nnyocha n’okwu ọnwụ ya.
O kwukwara na enweghị ego ọbụla ezinaụlọ ya kwụrụ maka nke a.
Etu Ifeanyi Slami siri nwụọ
Akụkọ pụtara na mbido izu a nke kwuru na agbagburu nwaamadị a sị dị afọ 31 nke a kpọrọ Slami Ifeanyi n’Awka, Anambra steeti ka na-akpọtụ na so soshal midia.
Ndị uweojii Anambra steeti ekwuola ihe ha ma maka ọnwụ nwaamadị dịka nnyocha nke mbụ ha siri gosi.
Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii na steeti ahụ bụ Tochukwu Ikenga gwara BBC Igbo
“Mgbagbu nwaamadị a abụghị okwu ndị ojiegbe amaghi ndị ha bụ nke ọtụtụ na-akpọ ‘Unknown gunmen’, nnyocha mbụ anyị merela ugbua na-egosi na mgbagbu ya bụ okwu esemokwu nọ n’etiti ndị otu nzuzo nke metụtara ya.”
Ikenga kọwara na ọtụtụ ndị mmadụ na-eke akụkọ an-ekesa ya mana na ọ bụghị etu ihe siri me ka ha sị akọ ya.
N’ozi o zigaara BBC Igbo o kwukwara:
“Anwụchiela mmadụ atọ a na-enyo enyo n’okwu mgbagbu nwaamadị a ugbua.”
N’ihe onyonyo na-efegharị na soshal midia, a hụrụ ebe ya bụ nwaamadị tọgbọ n’ime ụgbọala ya dịka ọtụtụ ọgbara na-agba ya n’ahụ.
N’onyonyo ahụ, ọ dị ka ndụ apụọla ya n’ahụ. Ebe e kwuru ya bụ ihe mere bụ n’akụkụ Umubere dị Akwa dịka ọtụtụ ndị bi nso ebe ahụ gbara ama na a nụrụ ụda egbe aghara aghara.
Ozi ndị uweojii kwukwara na ha natara ozi ụda egbe a sị nọ na-ada ebe ahụ aghara aghara n’ụbọchị Sọnde gara aga.
Ndị ma ya bụ nwaamadị kọwara na Slami bụ onye otiegwu ka na-etolite etolite.
Akara Facebook ya gosikwara na ya bụ nwaamadị esonyebuola n’asọmpị nwoke kacha mma nke Mr Universe 2014/2015 ma rite mmeri na ya.
Ọnọdụ enweghị nchekwa n’Ọwụwa Anyanwụ Naịjirịa
Na afọ ole m ole gara aga, ọnọdụ enweghị ezi nchekwa bịara bụrụ oke okwu n’akụkụ ọwụwa anyanwụ Naịjirịa nke gụnyere Anambra steeti.
Ọtụtụ otu ndị ojiegbe bịara malite na-awakpo, na-egbe, na-atọ ma na-agbakwa ụlọ ndị mmadụ na nke ndị gọọmentị ọkụ. Tinyere nke a, ndị otu nzuzo sokwa na-akpa ike n’akụkụ steeti ahụ dị iche iche ọkachasị n’Akwa.
Awka nke bụ isi obodo Anambra steeti ebe mahadum steeti ahụ nọ bụ ebe ya bụ ihe kacha akpọtụ.
Ugboro ugboro ka akụkọ na-apụta gbasara nkwafu ọbara nke sitere n'ọgụ dara n'etiti ndị otu ozuzo na ibe ha.
Ọtụtụ oge kwa ka ndị uweojii Anambra steeti kwurula na ha anwụchiela ụfọdụ ndị ntoroọbịa e boro ebubo ịnọ n'otu nzuzo, mana ihe na-eme ka na-emekwa.
Isi mmiri mmụbawanye ndị otu nzuzo a malitere na mahadum dị ịcheịche na Naịjirịa.
Dịka mahadum Nnamdi Azikwe malitere ọrụ kamgbe afọ 1991 n'Awka mgbe mkpamkpa na mmụbanwanye ndị otu nzuzo na mahadum sarara ọkụ, Akwa so ebe ndị akụkọ mwakpo n'aka ndị ntorobịa bụ ụmụakwụkwọ mahadum si apụta.
A na-arabanye ọtụtụ ụmụakwụkwọ mahadum n'ime otu nzuzo dị ịcheịche na Naịjịrịa.
Ndị ọrụ nchekwa ekwuola kwa mgbe kwa mgbe na ndị otu nzuzo ndị a na-eme ihe ike, ezu ohi, awakpo ndị mmadụ ma na-emekwa mpụ ndị ọzọ n'obodo.
Nke a mere e ji ha ji ebuso ha agha ma na-agbasa ozi na mahadum dị ịcheịche arịọ ụmụakwụkwọ ka ha hapụ isonye otu ndị a.
Gọọmentị Anambra steeti na-agba mbọ dịka ozi ha ugboro ugboro siri kwuo, ịdajụ oke tigbuo zọgbuo nọ na steeti ahụ maka ya bụ ihe ka na-aga n'ihu.