You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
Amaara m na nwa m ga-abụ 'odogwu' ma o too - Nne Burna Boy
Bose Ogulu bụ nne oti egwu a ma ama bụ Burna Boy ekwuola na site na mgbe nwa ya dị obere ka ọ maara na ọ ga-abụ nnukwu mmadụ.
Ogula gbara ama a na mkparịtaụka ya na BBC nwere ebe ọ sị na mgbe Burna ka dị afọ 13 maọbụ 14 ka o doro ya anya na ọ ga-abụ onye a ma ama n’ihe banyere iti egwu.
O kwuru na mgbe Burna Boy nọ na klassị JSS3 ka o bidoro na-aba n’ụlọ ebe a na-agwakọ egwu bụ ‘studio’ na Bekee.
“Amaara m kamgbe ọ dị afọ 13 maọbụ 14 na ọ ga-abụ nnukwu mmadụ n’otu ihe, na ihe ahụ ga-abụ iti egwu.”
“Ahụla m ya n’ụlọ ebe a na-eti egwu mgbe ọ nọ na klassị JSS3, ihe dịka afọ itoolu ya.
“O mechara hiwe otu ndị na-eti egwu mgbe n’ụlọakwụkwọ Sekọndịrị.”
Ogulu gara n’ihu kwuo onyinye iti egwu si n’aka nna mụrụ ya bụ nnanna Burna Boy.
“Nna m bụ onye asụsụ doro anya gbara mbọ ịhụ na anyị maara ndị anyị bụ ma duba anyị n’iti egwu.
“Ọ chịkwara oti egwu a ma ama bụ Fela Kuti ma hiwe otu egwu Fela nke mbụ.”
Nne Burna kwuru na-agbanyeghi ihe niile nwa Burna merela n’iti egwu na ije ka dị anya n’ebe ọrụ ya dị.
Kirie ihe o kwuru n’uju;