Ihe Pst Johnson Suleman kwuru maka ndị omekome a si wakporo ya, gbagbuo mmadụ asaa so ya

Suleman na ụgbọala a wụru mgbọ

Ebe foto si, Johnson Suleman/Facebook

Mgbe e biputara ya

Ndị bu egbe awakpoola ụkọchukwu a ma ama bụ Pastọ Johnson Suleman nke Omega Fire Ministries, gbagbuo ndị ya na ya so eme njem ruru asaa n'ọkporoụzọ si Auchi gawa Benin ụbọchị Fraide .

Akụkọ kwuru na mwakpo ahụ nke tara isi ndị uweojii atọ, ọkwọụgbọala abụọ na ndị ọzọ.

Suleman, onye kwuru na ya bụ ọdachi mere n'ezie kwuru na ya, nwunye ya nakwa ụmụ ha so na ndị isi ha pụta na ya bụ ihe mberede.

O kwuru na ihe onyonyo o wepụtara n'abalị Fraide sị, " Agbalahụrụ ndị chọrọ igbu m ugbua mana e gburu mmadụ asaa."

Johnson Suleman

Ebe foto si, Johnson Suleman/Facebook

Tigbuo-zogbuo gụnyere mwakpo, ntọ na oke igbu mmadụ arịala elu na mpaghara dị iche iche na Naijiria dịka ọnọdụ nchekwa adakpọrọla.

Pst Suleman boro ebubo n'ozi o wepụtara n'abalị Fraide na ọ bụ ndị iro ya kpara ajọ nkata ahụ mana na ọ chọghị ịkpọ aha ya.

O kwuru na ọ bụ ndị gbarala mbọ ifesa akụkọ ọjọọ banyere ya kemgbe 2017 iji memila ya, ọ mịtaghị mkpụrụ ka aka ha dị na ya bụ mwakpo."

" Ha wụrụ ụgbọala m mgbọ, nwunye na ụmụ nọ ebe ahụ."

" E gburu ndị uweojii na ndị ọzọ nọ n'ụgbọala nchekwa(escort car) nakwa ndị nọ n'ụgbọala bọọsụ so anyị aga."

Skip X post
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.

End of X post

Onye bụdị Pst Joshnson Suleman?

Johnson Suleman

Ebe foto si, Johnson Suleman

Pst Johnson Suleman bụ ụkọchụkwụ na-achịkọta ụka, "Omega Fire Ministries International nke isiụlọọrụ ha dị n'Auchi, Edo steeti."

A ma nwa amadị a gbara afọ 51 ama maka ịgbasa oziọma n'ihe onyonyo TV.

Ọ bụbu ụkọchukwu n' ụka " Armor of God Church' dị na Legọs tupu ọ malite ụka ya n'afọ 2004.

Suleman bụ ụkọchukwu aha ya na-akpọtụ akpọtu na soshal midia kemgbe afọ ole na ole gara aga dịka ọtụtụ ụmụnwaanyị gunyere ndị a na-anụ aha ha na-eme ihe ejije boro ya ya ebubo ịgba n'iro mana ọ gọọla agụgọ ugboro ugboro sị na ọ bụ ndị iro ya na-akwụ ndị ahụ ụgwọ imebi aha ya.

N'afọ 2017, Stephanie Otobo, otiegwu bi mba Kanada boro ebubo na ya na Sulleman onye ji nwaanyị na ụmụ yịrị n'afọ 2015 mana Suleman gọ rọ agọrọ na ọ bụ ebubo ụgha.

N'afọ 2022, onye ihe ejije abụọ, Halima Abubakar nakwa