Etu ndị ekperima si wakpo ọtụtụ ụgbọala bu ngwaahịa ndị mmadụ n'Anambra

Ebe foto si, Getty Images
Ndị ekperima amabeghị ndị ha bụ wakporo ọtụtụ ụgbọala na-ebu ngwaahịa okporoụzọ si Ọnịcha gawa Owerri n'ụbọchị Tọzde.
Ihe a mere na mpaghara Ekwusigo dịka ọnụ na-ekwuru ndị uweojii bụ Toochukwu Ikenga si gwa BBC Igbo n'ekwentị.
Onyonyo gbasara mwakpo a na-efegharị ugbua na soshal midia, dịka ndị mmadụ na-ekwu na ọ bụ ndị ekperima a na-akpọ 'unknown gunmen' mere ya bụ ihe.
Ndị mmadụ na-ekwukwa na ọ bụ na mpaghara Amorka nke dị n'okpuru ọchịchị Ihiala ka ya bụ ihe mere.
Mana Ikenga kwuru na ọ bụ ndị oji egbe ezu ohi wakporo ndị njem n'abalị ụbọchị Tọzde.
O kwuru sị: "Ihe ahụ merenụ bụ ndị ohi wakporo ndị njem, mana n'ihi na ha ezuteghị ole ego ha tụrụ anya, ha jizi iwe mụnye ọtụtụ ụgbọala ndị ahụ ọkụ," Ikenga kwuru.
"Mana ndị uweojii awụchiela ebe ahụ ma zọpụta ụfọdụ ngwaahịa ndị ekperima ahụ tinyere ọkụ. Anyị amalitekwala ọrụ iji chọta ma nwuchie ndị kpara arụ ahụ."
"Anyị ebulitekwala ọnụọgụgụ ndị uweojii na-akpagharị na mpaghara ahụ ugbua."
Etu akụkọ a si efesa na Twitter
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post
Enweghị nchekwa n'Ọwụwa Anyanwụ Naịjirịa
Nsogbu enweghị nchekwa na-agbali elu na mpaghara Ọwụwa Anyanwụ ugbua.
Nke a gụnyere mwakpo ụlọọrụ ndị ọrụ nchekwa, ogbugbu ndị uweojii na ndị agha, ntọrọ mmadụ na ihe ndị ọzọ.
Ndị ọrụ nchekwa Naịjirịa na-ekwu na ọ bụ otu 'Indigenous People of Biafra', nke bụ ndị na-alụ ọgụ maka nnwereonwe mpaghara ahụ, na-eme mwakpo ndị a.
Mana Ipob ekwuola ugboro ugboro na aka ha dị ọcha maka na ha abụghị otu na-achọ ọgbaaghara.
Onyeisi otu Ipob bụ Nnamdi Kanu ka nọ na mkpọrọ n'ụlọọrụ 'Department of State Services', nke bụ ndị ọrụ nchekwa nzuzo Naịjirịa.
Gọọmentị Naịjirịa boro Mazi Kanu ebubo na ọ bụ onye na-eyi ndụ egwu nakwa onye na-achọ ịkwatu ọchịchịonye kwuo uche ya na Naịjirịa.
Mana n'ọdị nso a ka ụlọikpe mkpegharị kụchapụrụ ebubo ndị ahụ ma kwuo na e kwesịrị ịtọhapụ Mazi Kanu ka ọ laa.





























