Gọọmentị Anambara aghọpụtala ndị okpe udo

Mgbe e biputara ya

Kọmishọna n'ahụ maka ikpe nkwụmọtọ n'Anambra steetị,Anali Chude, ahọpụtala ndị okpe udo ruru otu narị n' Anambara steetị.

Onye nkwuchite ọnụ mịnịstrị ahụ bụ Bernadette Nwadike sịrị na-ahọpụtara ndị a taa bụ thọsde, orie.

Chude kwuru na ndị ahọpụtara bụ ụmụnwoke na nwaanyi na-enweghị ntụpọ n'agwa ha.

Ọyọkwara ha ka ha kpezie ụdọ ma chekwa ikike onwe ndị Anambara nwere.

O kwuru na ọrụ ha ga-abụ inara mmadụ n'aka ebe,idu iyi,iduga mmadụ ụlọ ndị uweojii nakwa ikpe udo n'obodo niile.