Ihe atọ mere ụfọdụ ụmụnwaanyị anaghị ekwe eyi ọbante

Mgbe e biputara ya

Ị jụọ ụfọdụ ụmụnwaanyị ma n'ụlọ ma n'ama, ha ga-agwa gị na iyi ọbante (pant) anaghị amasị ha.

Ụfọdụ bụ ndị na-eyi ọbante ma a gụrụ gụrụ, ebe ndị ọzọ anaghị achọdị iji ntị anụ ihe gbasara iyi ọbante; iyi ọbante bụ etu o si masị onye.

Mana e nwere ihe ọjọọ dị n'iyi maọbụ eyighi ọbante? Ndị ọrụ ahụike ekwuola na ọ bụchaghị ihe ọjọọ, mana o nwere uru na ọghọm.

Ụfọdụ uru dị n'eyighi ọbante gụnyere na ikuku ga na-aba gị n'ahụ nke na-enyere aka igbochi ụfọdụ nje dị aṅaa nwaanyị nwereike isi n'agada ya bute.

Uru ọzọ bụ na ọ ga-enye aka ibelata isi nke ọsụsụ na-agba ebe ahụ nwere ike ibute; eyighi ọbante ga-eme ka ọsịsọ ahụ kọọ ma ghara ịtọ gị n'ahụ.

Ihe mere na ụfọdụ ụmụnwaanyị anaghị eyi ọbante

Na nso nso a ka otu ome ejije Nollywood a ma ama bụ Nkechi Blessing Sunday wuru ewu n'ihi na o kwuru na ọ naghị eyi ọbante.

O kwuru nke a iji saa onye ọ yịburu kwuru na ya na ya tisara n'ihi na Nkechi anaghị asa ọbante ya mmiri ọtụtụ ụbọchị.

Mana Nkechi sara ya sị na ọ na-ekwu na ọ naghị asa ọbante mmiri ebe ọ bụ na ọ kwụsịrị iyi ọbante oge o ruru afọ 18.

Nke a kpalitere okwu ihe mere ụfọdụ ụmụnwaanyị ji agbara iyi ọbante ọsọ. Lee ụfọdụ ihe ndị ahụ ebe a:

1) 'Achọghị m ka o gosi n'uwe m yi':

Nke a bụ ihe ụfọdụ ụmụnwaanyị ji ghara iyi ọbante, dịka ọ na-eme ha ihere ịchọpụta na ọbante ha yi n'ime na-egosi n'ime uwe ha yi.

Ọkachasị mgbe uwe ahụ na-eke eke maọbụ mgbe uwe ha yi na-egosi ihe ị yi n'ime.

Ụfọdụ ụmụnwaanyị na-eji n'ihi nke a ghara igbu oge iyi ọbante chaa chaa makana ha achọghị ka ndị onye ọbụla sị ha "onye nwe pantị nọ n'iro".

N'agbanyeghi na a rụpụtachaala ụdịrị ọbante dị iche iche iji gbochie ụdịrị ọgbatughie a, gụnyere nke a kpọrọ 'thong' (na-fanye n'ike), 'seamless panties' (nke na-anaghị egosi eriri maọbụ akara ọbụla n'okpuru akwa) wdgz, ụfọdụ ụmụnwaanyị na-ekwu na ọ kaara ha mma ịhapụcha iyi nke ọbụla ma ncha.

2) 'Ọ na-enye m nsogbu n'ike':

Otu ihe ọzọ mere ka ụfọdụ ụmụnwaanyị na-agbara ọbante ọsọ bụ na ọ na-enye ha nsogbu maọbụ emekasị ha ahụ.

Ụfọdụ ụmụnwaanyị ekwuola na oge mbụ ị ga-ekpebi na ị gaghị eyizikwa ọbante, ọ ga-adị gị ka ị gba ọtọ, mana ọ bịa mara gị ahụ, ị bido mesapụwa ahụ, ọ dịrịzịa gị mfe.

Ụfọdụ kwuru na iyi ọbante na-enye ha nsogbu n'ike, mana ha yipu ya maọbụ kwụsị iyi ya, ikuku abaa ha ahụ, ọbara agagharịwa ha n'ahụ ọfụma, ọkachasị tupu ị rahụ ụra.

3) Ụfọdụ na-atụ ụjọ ọrịa o nwereike ikpalite:

Ndị ahụike na-akọwa na ụdịrị ọbante i yi na ụdịrị akwa e ji kwaa ya nwereike ime ka nje (bacteria) wakpoo akụkụ ahụ ahụ ma bawanye.

Ụdịrị akwa e ji kwaa ọbante nwereike igbochi ikuku na-abata n'agada, nke ga-eme ka ọsụsụ ju ma mụbawanye nke nwereike ibute nsogbu 'yeast'.

Nje ndị ahụ na-enye ụmụnwaanyị nsogbu n'agada, ụfọdụ oge ọ na-akọ ezigbo ọkọ ma na-afụkwa ụfụ.

Iyi ọbante pụtara na ị ga-asanụ ya mmiri, ndị ọrụ ahụike na-akọwa na iji ụfọdụ ncha dị aṅaa saa ọbante nwereike itinye gị na nsogbu Bacterial vaginosis (bụ mgbe ọnọdụ e ji kee ikpu gị gbanwere), n'ihi ụdịrị kemịkal dị na ya.

Ọbante (ọkachasị nke akọchaghị akọ) nwereike itinye ụfọdụ nje dị aṅaa n'ime ike nwaanyị.

O nwereike ịkpalite ihe Bekee kpọrọ 'skin irritation' nke ga-emerụ gị ahụ ma ị kọọ ya ọkọ.