Nigerian Presidency 2023: ‘Anyị na-enye Tunde Bakare abalị asaa ka ọ rịọ mgbaghara maka okwu asị megide Igbo maọbụ ... ' - Otu Igbo Board of Deputies

Otu Igbo Board of Deputies bụ otu sị na na-arụ ọrụ ikwado ndị igbo na ihe gbasara ọdịmma ha

Ebe foto si, Igbo Board of Deputies/Tunde Bakare/Facebook

Mgbe e biputara ya

Otu ndị Igbo nọ mba ofesi kpọrọ onwe ha, 'Igbo Board of Deputoies' enyela ụkọchukwu a ma ama bụ Tunde Bakare abalị asa ịrọ mgbaghara maka okwu 'asi' o kwuru megide ndị Igbo maọbụ ha kpụ ya ụlọikpe.

Otu Igbo Board of Deputies bụ otu sị na na-arụ ọrụ ikwado ndị igbo na ihe gbasara ọdịmma ha n'akụkụ ụwa dị ịcheịche kwuru nke a n'akwụkwọ ozi ha wepụtara na nsonso a.

Nke a bụ ọsịsa ha na-enye Bakare n'okwu ozi o ziri n'ụlọụka ya bụ Citadel Global Community Church n'ọnwa Eprel, 2022 bu ebe ọ sịrị na tupu Tafawa Balewa a nwụọ, na o bụrụ Igbo ọnụ sị na o nweghi onye agbụrụ a ga-achị Naịjirịa.

Akwụkwọ ozi a kwuru na okwu Bakare bụ okwu mkwugidi dịka ha zigara ya ọtụtụ otu mba ụwa nakwa ndị nnọchịteanya mba dị ịche ịche nakwa ọkaiwu Gọọmentị Naịjiria.

Akwụkwọ ozi otu Igbo Board of Deputies nke pụtara n'ụbọchị 19 n'ọnwa Eprel, 2022 si n'aka ndị onye ọkaiwu ha kwuru na ha na-enye Bakare abalị asaa ka ọ rịọ mgbaghara ma kwugharịa ihe o kwuru dịka ha gara n'ihu kwuo na ọ meghị nke a na ha ga-agba ya akwụkwọ n'ụlọikpe.

Otu a kwukwara na ozi Bakare pụtara n'oge ọtụtụ esemokwu nọ n'etiti ọtụtụ agbụrụ na Naịjirịa nke bụ na ọ nwereike ikpalịte ọgbaghara.

Otu a kọwakwara na ha e kwenyeghị n'ihe a sị Bakare kwuru bụ na aka chịbụru Naịjirịa bụ Tafawa Balewa bụrụ ndị Igbo ọnụ maka etu a sị e siri gbuo ya.

Ugbua, a ka na-eche ka Bakare saa akwụkwọ ozi a.

Ọtụtụ ndị si mpaghara Ọwụwa Anyanwụ kpụ ụkọchukwu Tunde Bakara nke ụlọụka Citadel Global Community n'ọnụ maka ihe ha sị na o kwuru banyere onye Igbo ịchị Naịjirịa.

Nke a na-abịa dịka ihe onyonyo ebe ụkọchukwu a na-agbasa ozi n'ụlọụka pụtarachara ihe.

Ụkọchukwu Tunde Bakare

Ebe foto si, The Citadel Global Community Church

Kedụ ihe ụkọchukwu a kwuru?

Bakare mailtere okwu site n'ajụjụ sị 'gịnị mere mmadụ ga-eji emepe ọnụ sị na onye Igbo enweghi ike ịchị Naịjirịa, ọ bụ na ha esoghi na Naịjirịa?

Ọ sị ka o kwuo ihe mere onye Igbo agahị abụ onyeisiala Naịjirịa, na ọ chọrọ iwepu ọnụ abụrụ ha.

Bakare sị na mgbe Sam Mbakwe bụbu gọvanọ Imo Steeti kpọrọ ya oku n'Owerri n'afọ 1993 na ọ kọọrọ akụkọ ahụ.

Ọ sị na ụbọchị e gburu Tafawa Balewa, na e kpupuru okpu 'turban' o kpu n'isi, chee ya mmanya n'ọnụ tupu a gbagbuo ya.

"Na tupu Balewa a nwụọ, o bụrụ ọnụ sị na o nweghi onye agbụrụ unu ga-achị Naịjirịa".

Bakare sị na ọ chọrọ ịkagbuo abụmọnụ ahụ maka na ndị ọgbọ Igbo na mgbe ahụ abụghị ndị nọ ugbua ya mere ị gaghị e ji ya atụnyere ha.

Ọ gara n'ihu kpee ekpere sị a kagbuo ọnụ Balewa a bụrụ ndị Igbo na Naịjirịa.

Ihe i kwesịrị ịma maka Tunde Bakare

Ụkọchukwu Tunde Bakare

Ebe foto si, The Citadel Global Community Church

  • Ezi aha ya bụ Babatunde Gbolahan Bakare, ọ bụ onye Abeokuta dị n'Ogun Steetị, a mụrụ ya n'afọ 1954.
  • Ọ hụrụ akwụkwọ na Grammar School dị n'Abeokuta, mahadum Legọs Steetị.
  • Ọ bụ onye ọkaiwu, onye ndọrọ ndọrọ ọchịchị ma bụrụkwa ụkọchukwu.
  • Ọ zọrọ ọkwa osote onyeisiala Naịjirịa mgbe onyeisiala Muhammadu Buhari zọrọ ọkwa n'afọ 2011 mana ha dara.
  • Ọ rụrụ ọrụ ụkọchukwu n'ụlọụka Deeper Life, Redeemed tupu o mepee nke ya.
  • O nwere mgbe a nwuchiri ya n'ọnwa Maachị afọ 2022 mgbe o gbasara ozi ma katọọ onyeisiala Naịjirịa nọ mgbe ahụ bụ Olussegun Obasanjo.

Onye bụ Tafawa Balewa?

Naịra ise
Nkọwa foto, E biri ihu Tafawa Balewa n'ego naịra ise nke Naịjirịa
  • Balewa bụ onye ndọrọndọrọ ọchịchị sị Bauchi Steeti nke mpaghara Ugwu Naịjirịa
  • A mụrụ ya n'ọnwa Disemba afọ 1912 n'ezinaụlọ Yakubu Dan Zala na Fatima Inna.
  • Ọ gụrụ akwụkwọ na ụlọakwụkwọ Qur'anic, Barewa College, Mahadum London maka nkuzi ihe.
  • Ọ rụrụ ọrụ dịka praịm minista mbụ nakwa naanị praịm minista Naịjirịa nwere n'oge ha nweere onwe ha n'afọ 1960.
  • Ọ nọrọ n'ọkwa ahụ site n'afọ 1957 ruo n'ọnwa Jenụwarị afọ 1964 tupu ndị ndịagha Naịjirịa ewere ọchịchị n'ike ma gbuo ya n'afọ 1966.
  • Ọ gbara afọ iri ise na atọ mgbe ọ nwụrụ. Ọ lụrụ ụmụnwaanyị anọ ma mụọ ụmụ iri na itoolu.

Ihe ụfọdụ ndị Igbo kwuru

Sịnetọ na-anọchite anya Imo West n'ụlọomeiwu Naịjirịa

Ebe foto si, Senator Rochas Okorocha

Ọtụtụ ụmụafọ Igbo gbarụrụ ihu n'okwu ahụ ụkọchukwu Bakare kwuru ma sị na "gịnị mere o jiri kwuo na onye agaghị achị Naịjirịa".

Otu n'ime ndị katọrọ okwu a bụ Sịnetọ Rochas Okorocha na-anọchite anya Imo West n'ụlọomeiwu Naịjirịa.

Okorocha sị na "o nweghi ọnụ ọbụla a bụrụ ndị Igbo, a gaghịkwanụ abụ ha ọnụ,"

Ha bụ ndị udo na ndị na-agbasa udo, a gọziri ha agọzi, ha bụkwa ezigbo ngwaọrụ nye Naịjirịa."

Ọ gara n'ihu kwuo ka pati APC gbalịa mee ka onye Igbo jiri ọkọlọtọ ha zọọ ọkwa onyeisiala n'afọ 2023.

Okorocha so na ndị Igbo kwupụtarala uche ha ịzọ ọkwa onyeisiala Naịjirịa n'afọ 2023 n'aha All Progressive Congress (APC).