Nigeria Spider Man: Ihe mere m ji eke ekike pụrụ iche ma m na-ekpocha ahịhịa
Jonathan Olakunle malitere ọrụ mkpocha na nzacha okirikiri ya n'afọ 2004.
Mana oge ọbụla ọ na-arụ ọrụ a, ndị mmadụ na-achị ya ọchị, ọtụtụ anaghị ekwe abịa esonyere ya.
Nke a mere o ji chepụta echiche ọzọ nke ga-eme ka ndị mmadụ nwee mmasị isoro ya na-ekpocha okirikiri ya.
Ọ malitere ike ekike dịka 'Spider Man' oge ọbụla ọ na-arụ ọrụ mkpocha na nzacha.
N'ụzọ dị otu a ka o si dọta uche ọtụtụ ndị mmadụ, ụfọdụ na-abịa ese ya onyonyo, ndị ọzọ na-abịa etinyere ya aka n'ọrụ.
Jonathan Olakunle na-ejikwa ohere ahụ na-akụziri ndị mmadụ mkpa ọ dị idebe okirikiri ha ọcha.
"Ọtụtụ ụmụ Naịjirịa, ha pụọ mba ofesi, ha na-erube isi n'iwu dị ebe ahụ, na-edebe ebe niile ọcha," Olakunle kwuru.
"Mana ngwangwa ha lọtara Naịjirịa, ha amalite ime ihe masịrị ha."
"Ekwenyeghị m na anyị bụ ndị na-eru unyi."
Ọ dị mkpa ka anyị mara na ịdị ọcha obodo bụ ọrụ dịịrị mmadụ niile, o bụghị naanị gọọmentị."
Olakunle kwukwara na ọrịa dị icheiche na-efegharị ugbua bụ n'ihi na okirikiri niile ruru unyi.
Ọ gara n'ihu kwuo na gọọmentị nwekwara ọrụ gbasara ịdị ọcha obodo.
"Anaghị ahụzi ka ndị ọrụ idebe obodo ọcha na-agagharị n'ụlọ n'ụlọ dịka ọ dị na mbụ."
"Naịjirịa kwesịrị ịbụ ebe dị ọcha maka mmadụ niile."
"Ọ dị mkpa ka anyị kwụsị iwufu unyi aghara aghara."
"Kwụsị iwufu unyi n'elu ala maọbụ n'ime ọwa mmiri."


