A nwuchiela ndị nwe ụlọakwụkwọ makwa ndị nkuzi niile ebe ụmụaka atọ na-efu efu n'Abuja

ụmụakwụkwọ

Ebe foto si, Getty Images

Mgbe e biputara ya

Ndị uweojii nke Kabusa dị n'Abuja anwuchiela ndị nkuzi na ndị nwe ụlọakwụkwọ Star Child Academy maka ụmụaka atọ furu ebe ahụ ụbọchị Tuzde.

Marvelous, Alex na Rehoboth Sunday furu ka ha gachara akwụkwọ ụbọchị ahụ.

Nne ya gara ibute ha mana ha ahụghị ya.

Mbọ niile ha gbara ịchọta ha lara ha n'efu ụbọchị ahụ.

Ndị ogbe ha na Kabusa mere ngagharịiwe, igosi iwe ha maka ya bụ arụ mere.

Aha onyonyo, Nne na nna Chibuike ji foto nwa ha furu efu

Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii na ogbe ahụ bụ Josephine Adeh sị na ha ma maka ya bụ ogwu mana na ha ka eme nnyocha ya.

Ọ sị na "anyị anwuchiela ndị nwe ya bụ ụlọakwụkwọ na ndị nkuzi ha ka ha nyere anyị aka na nnyocha anyị na-eme".

Akụkọ a ka na-abịa.