Ibrahim Badamasi Babangida: Ihe i kwesịrị ịma maka ya

Babangida chịrị Naịjirịa dịka onye agha site n'afọ 1985 ruo 1993

Ebe foto si, AFP

Nkọwa foto, Babangida chịrị Naịjirịa dịka onye agha site n'afọ 1985 ruo 1993
Mgbe e biputara ya

Ibrahim Badamasị Babangida bụ otu n'ime ndị ọchịagha chịrị Naịjirịa nke ugboro asatọ site n'afọ 1985 ruo n'afọ 1993.

A mụrụ Babangida n'obodo Minna dị na Niger Steeti n'afọ 1941 n'ime ezinaụlọ nne na nna ya bụ Muhammad na Aisha Babangida.

Ọ gụrụ akwụkwọ praịmarị n'afọ 1950 ruo 1956, gụọ nke sekọndịrị na Government College Bida site n'afọ 1957 ruo 1962.

Ọ banyere n'ọrụ ndịagha Naịjirịa n'ọnwa Disemba afọ 1962, mgbe ọ gara ọzụzụ na Nigerian Military Training College dị na Kaduna.

Ọ natara ọzụzụ ndịagha na mba India nakwa na Briten.

Babangida so na nnapụ ọchịchị n'ike e mere n'afọ 1966 nke mere e ji chụpụ ọchịagha Aguiyi Ironsi ma were ọchịagha Yakubu Gowon dochie ya.

Oge agha Biafra;

Babangida so na ndịagha Naịjirịa buru agha megide ndị Biafra site n'afọ 1967 ruo n'afọ 1970 mgbe ọ bụ onye ndu ndịagha 'Infantry Battalion' n'afọ 1968.

N'afọ 1969 a gbara ya egbe n'akụkụ obi, mgbe agha na-ada n'etiti Enugwu na Umuahia mana ọ mechara gbakee.

Ọ lụrụ nwunye ya bụ Maryam King n'ụbọchị isii nke ọnwa Sepụtemba, afọ 1969.

Aha onyonyo, O meela afọ 50, a lụrụ Biafra, mana ihe kpatara ya ka na-eme

Mgbe agha biri

Mgbe agha biri n'afọ 1970, e buliri Babangida n'ọkwa ugboro abụọ ma ziga ya na Nigerian Defence Academy dịka onye ntuziaka.

Ọ gara ọzụzụ na mba Amerịka site n'ọnwa Ọgọọstụ afọ 1972 ruo ọnwa Juun afọ 1973.

Babangida nwetere mbuli elu n'ọkwa nakwa ọzụzụ dị iche iche site n'afọ 1973 ruo 1985.

Nnapụ ọchịchị n'ike

Babangida azọla ọchịchị n'oge gaara aga

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Babangida azọla ọchịchị n'oge gaara aga

N'afọ 1975 mgbe Babangide ji ọkwa onye ndu ndị a kpọrọ 'amoured corps', o tinyere aka napụ ọchịchị n'ike.

Mana n'afọ 1976, o gbochiri atụmatụ nnapụ ọchịchị n'ike site n'ịkpa ụlọ mgbasaozi Radio Naịjirịa, nke mere e jiri gbuo ọchịagha Murtala Muhammed.

N'afọ 1983, ọ haziri nnapụ ọchịchị n'ike site n'aka ndị nkịtị ma tinye n'aka ndịagha nke tinyere ọchịagha Muhammadu Buhari n'ọchịchị.

Mgbe e ruru afọ 1985, ọ hazi kwara nnapụ ọchịchị n'ike n'aka ọchịagha Buhari ma tinye onwe ya dịka ọchịagha na-achị Naịjirịa.

Nhazi ntuliaka

Onye chibụrụ Naịjirịa bụ Ibrahim Babangida

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, IBB ekwuala na ọ ya ziri Kassim ozi o jere

N'ọtụtụ oge mgbe Babangida nọ n'ọchịchị, ọ nwara ịhazi ntuliaka iji nyeghachị ndị nkịtị ọchịchị mana ọ dabaghị.

E ruru n'ọnwa Juun, afọ 1993, e mere ntuliaka ịhọpụta onyeisiala, mana ọ kagburu ya sị na e nwere nrụrụaka.

Nke a butere ọtụtụ ngagharịiwe banyere ọgbaghara na mpaghara Ndịda Anyanwụ Naịjirịa.

N'ihi ọgbaghara ahụ kawanyere njọ mere ka Babangida gbaa arụkwaghịm n'ọnwa Ọgọọstụ 1993 ma nyefee Ernest Shonekan ọchịchị nchere oge.

Dịka ọnwa ole na ole gachara, ọchịagha Sani Abacha napụrụ Shonekan ọchịchị ahụ n'ike.

Ezinaụlọ ya

Ọchịagha Ibrahim Babangida lụrụ nwunye ya bụ Maryam n'afọ 1969 mana ọ nwụrụ n'afọ 2009.

Ha mụrụ ụmụa anọ gụnyere Aisha, Muhammad, Aminu na Halima.