Regina Daniels Vs Jaruma: Ụlọikpe enyela iwu ka a nwụchigharịa Jaruma

Ebe foto si, Instagram/Ned Nwoko/Jaruma
Ụlọikpe nke Abuja enyela ntụziaka a hụ Hauwa Saidu a ma ama dịka Jaruma sị jide ya dịka nwa ada ahụ apụtaghị n'ụlọikpe taa n'ikpe ya na Ned Nwoko.
Ọkaikpe bụ Ismail Abdullahi Jibrin nyere iwu ka ndị uweojii nwụchigharịa ya ma jide ya ruo abalị 17 nke ọnwa Maachị afọ 2022 bụ ụbọchị e higharịrị ikpe ya.

Nke a bụ n'ihi na iwe gbara ọkaikpe na Jaruma na Ọkaiwu ya abịaghị ụlọikpe nke ha na-ezite n'ụlọikpe dịka e nwere ikpe ha ụbọchị Wenezde.
Ndị uweojii kpụpụrụ Jaruma, onye na-ere ọla aka na ngwa ụmụnwaanyị, ụlọikpe maka ebubo metụtara mmetọ aha Ned Nwoko bụbụ onyeomeiwu.
Nghọtahie dabụtara n'etiti Jaruma na nwunye Nedu Nwoko bụ onye ejije a ma ama bụ Regina Daniels.
Ned Nwoko vs Jaruma: Ụlọikpe atọhapụla Jaruma dịka ọ nọrọ abalị anọ n'ụlọ mkpọrọ

Ụlọikpe ukwu dị n'Abuja enyela iwu ka a tọhapụ Hauwa Saidu Mohammed, onye e ji Jaruma mara, n'okwu dị n'etiti ya na ọkaiwu a ma ama bụ Ned Nwoko
Ọkaikpe Ismail Abdullahi Jibril nyere iwu a n'ehihie Fraịde, Jenụwarị 28, ma kwuo ka Jaruma kwụọ ego dị Puku Narị naịra ise (N500,000).
O nyekwara iwu ka Jaruma kpọta otu onye ga-ana ya n'akaebe.
Onye ahụ ga-abụ onye ọrụ oyibo nọ n'ogogo 'Level 12', biri n'Abuja, ma wetakwa ego dị N500,000.
Esemokwu dị n'etiti Jaruma na Regina Daniels

Ebe foto si, Instagram/Jaruma Empire
Regina Daniels na Jaruma dịbu na mma dịka ha si egosibu n'akara 'Instagram' ha.
Mana ọ dịka e nwere nghọtahie dapụtara n'etiti ha n'ihi azụmahia.
Jaruma boro ebubo na Regina Daniels riri ego ya dị nde naịra iri (N10m), mana ọ rụghị ọrụ ọ sị ya rụọrọ ya.
Regina n'aka nke ya kwuru na ya mere ihe ya na Jaruma kwekọrịtara, mana Jaruma chọrọ ihe ọzọ.
Etu Ned Nwoko si bata n'okwu ahụ bụ maka ebubo Jaruma boro gbasara nkewa ya na otu n'ime ndị nwunye ya.
Ihe Regina Daniels kwuru

Ebe foto si, Instagram/Regina Daniels
N'ihe o dere n'akara 'instagram' ya n'abalị Tọzde, Jenụwarị 27 2022, Regina Daniels kọwara na ọ rụrụ ọrụ Jaruma kwụrụ ya ụgwọ ka ọ rụọ, mana Jaruma chọrọ ka o meere ya ihe ndị ọzọ bụ nke ya onwe jụrụ ime.
O kwuru na ụfọdụ ihe ndị ahụ Jaruma chọrọ ka ya mee metụtara di ya bụ Ned Nwoko, mana ọ gwara ya ka o wepụ aha di ya na mkparịtaụka ha abụọ.
"Nkwekọrịta mụ na Jaruma nweburu bụ naanị ka m tinye ahịa ya n'akara 'Instagram' nke m, mana ọ bịara chọwazie ka m na-aụta n'onyonyo ebe m na-eyi ụfodụ ihe ndị ọ na-ere," Regina kwuru.
"Jaruma mebiri adịmnamma mụ na ya oge o kwuru na ọ bụ mụ kpatara nnukwu ọgbaaghara dị n'ezinụlọ m. Ezigaara m ya ozi ka o wepu ihe ahụ o dere mana o wepụghị ya."
Regina kọwara na nnwuchi a nwuchiri Jaruma nakwa mkpọrọ a tụrụ ya agbasaghị nkwekọrịta ha abụọ nwere, kama ọ bụ maka akụkọ ụgha niile Jaruma na-agbasa megide di ya bụ Ned Nwoko.
Ihe Jaruma kwuru

Ebe foto si, Instagram/Jaruma Empire
N'ọtụtụ ihe o dere nakwa onyonyo o tinyere n'akara 'Instagra' ya, Jaruma boro ebubo na Regina Daniels riri ego ya.
N'akara Instagram ya n'ụbọchị Jenụwarị 22, Jaruma dere ihe ma kwuo sị: "Ha gbalịrị iji ndị uweojii mba Dubai nwụchie m, mana ọ gazighịrị ha n'ihi na ndị uweojii Dubai ma na aka m dị ọcha."
"Ụmụaka abụọ na-ese okwu, okenye nwoke dị afọ 74 bịa buru onwe ya tinye n'ime ya, were ndị uweojii Naịjirịa na-emekpa m ahụ."
Jaruma akpọghị Ned Nwoko aha n'ihe ahụ o dere, mana o tinyere foto ya na Ned nakwa Regina sere n'oge gara aga.
Ọ gara n'ihu tinye onyonyo ebe o kwuru na e nwere otu nwoke akaọrụ ya bụ iji akụnụba ya na-emegbu ndị ntorobịa Naịjirịa.
Ọ sị: "Oge ọbụla e tinyere aha mmadụ na 'Google', ihe a ga-ahụ bụ naanị aha ndị mmadụ ọ kpọchiri na mkpọrọ. Ọ chọrọ ka anyị tụwa ya ụjọ?"
Jaruma akpọghịkwa Ned Nwoko aha n'onyonyo ahụ, mana ọtụtụ ndị mmadụ kwuru na o ji ụzọ aghụghọ atufere ya okwu.
Etu okwu a si malite
Okwu a malitere oge otu n'ime nwunye Ned Nwoko aha ya bụ Laila Charani, onye mba Morocco, kwuru na ya na Ned ekewaala.
Ndị mmadụ malitere ikwu na ọ bụ ike dị na 'kayanmata' Jaruma na-ere mere Laila na Ned ji gbaa alụkwaghị m.
Ha kwuru na ọ bụ 'kayanmata' Jaruma ka Regina Daniels ji chụọ Laila Charani.
Mana Regina were iwe ma kwuo na ọ bụ eziokwu na ọ na-etiri Jaruma mkpu ahịa n'oge mbụ, mana onweghị ihe gbasara ya na 'kayanmata' ọ na-ere.
N'ọnwa Nọvemba 2021, Ned Nwoko bụ di Regina Daniel sara Jaruma okwumaka ebubo na ọ bụ 'kayanmata' ka Regina ji jide ya.
Mana o mechara wega mkpesa n'aka ndị uweojii megide Jaruma.
Ebubo Ned Nwoko boro Jaruma

Ebe foto si, Instagram/Ned Nwoko/Jaruma
N'akwụkwọ ebubo Ned degaara onyeisi ndị uweojii n'Abuja, o boro Jaruma ebubo ndị a:
- Na Hauwa Saidu Mohammed, bụ onyeisi ụlọ ahịa 'Jaruma Empire' na-agbasa akụkọ ụgha megide Ned Nwoko.
- Na asị niile ahụ Jaruma na-agbasa nwere ike imetọ aha Ned Nwoko ma mekwaa ka ndị mmadụ kpọọ ya asị
- Na Jaruma bụkwa onye na-eji akara soshal midia ya na-akpagbu na emegidekwa Ned Nwoko ọkachasị gbasara nkewa ya na nwunye ya bụ Laila Charani.
- Na Jaruma na-eresị ndị mmadụ ọgwụ dị icheiche nwe-enweghị nnyocha e mere gbasara ha
Oge okwu ahụ pụrụ n'ụlọikpe, Jaruma kwuru na ikpe amaghị ya. Ọkaiwu Jaruma bụ James Odibe gwara ụlọikpe ka a tọhapụ ya, mana ọkaikpe yigharịrị ikpe ahụ ka ọ dị n'ụbọchị Fraịde, abalị iri abụọ na-asatọ nke ọnwa Jenụwarị.
Ọkaikpe nyekwara iwu ka e debe Jaruma n'ụlọ mkpọrọ dị na Suleja rue ụbọchị ahụ a ga-ekpe ikpe iji gbapụta ya.
Etu e si nwuchie Jaruma

Dịka ọkaiwu Ned Nwoko si kwuo, ndị uweojii kpọrọ Jaruma n'ụlọọrụ ha n'ụbọchị Fraịde, abalị iri abụọ na otu nke ọnwa Jenụwarị, mana oge ha hụrụ na ọ kpọ nwa ya bịa, ha gbachara ya ajụjụ ọnụ ma hapụ ya ka ọ laa.
N'ụbọchị Mọnde, Jenụwarị 24, ka e wepụrụ okwu ahụ n'ụlọikpe, ebe ọkaikpe nọrọ nye iwu ka e jide Jaruma n'ụlọ mkpọrọ ruo ụbọchị Fraịde, Jenụwarị 28, oge a ga-ekpebi ikpe mgbapụta ya.
































