'Anyị ka kpechara udo mgbe ndị 'unknown gunmen' batara gbagbuo mmadụ abụọ' - APC Enugu steeti

Mgbe e biputara ya

Ndị pati All Progressives Congress (APC) n'Enugwu steeti nọ n'iru uju ugbua n'ihi etu ndị ojiegbe a na-akpọ 'unknown gunmen' si gbagbuo ndị otu ha abụọ.

Nke a mere ebe ha gbakọrọ na-eme nzukọ udo n'Obeagu Hall, n'ụbọchị 18 nke ọnwa Janụwarị 2022.

Ndị ojiegbe a tọrọkwara otu onye a na-akpọ Monday Ogbonna, ebe ụfọdụ ndị ọzọ gụnyere onye a na-akpọ Okwadike (onyeisi ndị nnupuisi) ka bu mgbọ egbe n'ụlọọgwụ.Maazị Ifeanyi Egbo bụ odeakwụkwọ otu pati APC n'Obeagu wọọdụ 3, gwara BBC na ya bụ mkpa mkpa kpara mgbe ha gbakọrọ na nzukọ ịkpe udo n'etiti ndị na-ese okwu n'otu ha.

O kwuru na ozugbo ha mechara ya bụ nzukọ ebe elekere isii nke mgbede, ka ndị ojiegbe ahụ batara gbawa ndị mmadụ egbe.O kwuru etu ha si gbagbuo Kelvin Ezeoha bụbu onyeisioche na otu onye ọzọ, nakwa etu ha si tọrọ Ogbonna.

Egbo kwuru na ya bụ ihe gbagwojuru ha anya ma bụrụ ihe mgbawa obi n'ihi na ha ekpechaala udo, makụọ onwe ha dịka ụmụnne, tupu ọdachi ahụ adaa.

Ka ọ dị ugbua, ebe niile n'Obeagu nọ n'iru uju.

Kọmịshọna ndị uweojii na steeti ahụ bụ Abubakar Lawal ekwuola n'ụbọchị Wenzde na ha ga eforo ntutu taa ịhụ na ha nyochapụtara ndị mere ihe a.

O kwuru nke a mgbe ọ gachara njem nleta ebe ihe a mere n'Obeagu.

Ụfọdụ kwuru na ọ bụ na pụtara imanye ndị mmadụ iwu nọro n'ụlọ n'ụbọchị ahụ mere ihe a mana ndị uweojii agbabeghi aka ebe maka nke a.

Cheta na n'afọ 2018, ndị ndọrọndọrọ ọchịchị APC nke Enugwu ji ịlụ ọgụ na ngagharị iwe kposaa ntuliaka ha kwesịrị iji họpụta ndị ọchịchị ọhụrụ na pati ha.

Mgbe BBC Igbo rutere ebe ha na-eme ntuliaka ahụ, narị kwụrụ narị ndị mmadụ bucha akwụkwọ na-eme ngagharị iwe ma na-ekwuputa aha onye ha chọrọ ka ọ chịa ha.

Gịnị bụ iwu onye nọrọ n'ụlọ (Sit-at-home)?

Iwu onye nọrọ n'ụlọ (Sit-at-home) nke a na-eme hụrụ kwa ụbọchị Mọnde n'izu ọbụla n'akụkụ mpaghara ọwụwa anyanwụ Naịjirịa dị ịcheịhe malitere n'aka otu Indigenous People of Biafra (Ipob) bụ otu sị na ha na-achọ nwereonwe ndị Igbo n'aka Naịjirịa.

Ha tiri iwu n'afọ 2021 ma mecha kagbuo ya.

Ebumnobi ha mgbe ha tiri iwu a dịka ha si kwuo na mbido bụ iji gosi iwe ha maka etu gọọmentị Naịjirịa si nwụchịe onye ndu ha bụ Nnamdi Kanu n'ọnwa Juun 2021 nakwa iji kwanyere ya ugwu.

Agbanyeghi na ha kagburu ya bụ iwu, ha na-agakwa n'ihu tie iwu ahụ mgbe ọbụla akpọpụtara onye ndu ha ụlọ ikpe dịka ọ nọ n'aka otu ndị uweojii Naịjirịa pụrụiche a na-akpọ "Department of State Service" (DSS).

Dika otu Ipob kwuru na ha kagburu iwu a n'oge gara aga BBC Igbo hụrụ kwa ụbọchị Mọnde n'izu ọbụla na ọtụtụ ndị mmadụ n'ọwụwa anyawụ Naịjirịa na-eji ụjọ nọrọ n'ụlọ dịka akụkọ mwakpoo nakwa ọgbaghara na-adapụtakari n'ụbọchị ahụ nke na-agụnye akụkọ ntọrọ, ogbugbu ndị mmadụ, mwakpoo ụlọọrụ ndị mmadụ, mwakpoo ndị njem, mwakpoo ndị uweojii nakwa ụlọọrụ ha wdgz.

Ndị ojiegbe amaghi ndị ha bụ na-amanye ndị mmadụ iwu a ma ha pụta gaa mkpa ha n'akụkọ ọwụwa anyawụ Naịjirịa dị ịcheịche.

Ọ bụ gịnị na-esere ndị otu APC n'Enugu Steetị?

N'agbanyeghi na ọ dịka ihe na-agara otu pati All Progressive Congress (APC) wara wara n'ọchịchị akụkụ Naịjirịa dị ịcheịche, ọ dịka mpaghara ọwụwa anyawụ esonyeghi na ya bụ ụgbọ.

Agbanyeghi na APC emechala nọrọ n'oche ọchịchị na Imo nakwa Ebonyi Steetị, APC n'Enugu steeti kamgbe afọ ole m ole nọ n'ọgụ na mgba ọkachasị na ndọrọndọrọ ọchịchị ime ụlọ pati ahụ.

Ka akụkọ si kwuo n'afọ 2015 oge amalitere nkwado ntuliaka nke afọ ahụ, Ihe butere ọgbaghara na esomeokwu na ya bụ patị gụnyere na ụfọdụ ndị isi ebe ahụ kpara nkata kụpụ ego n'akpa patị ahụ n'ụzọ na-ezighị.

Ebubo a gụnyere ego mgbasaozi na achụmnta vootu maka onyeisiala.

Ihe ọzọ e kwukwara kpalitere esemokwu ebe ahụ bụ okwu nhazi ọkwa ọchịchị ọkachasị ọkwa minista dị ịcheịche.

Esemokwu a pụtara ihe mgbe ụfọdụ ndị pati ahụ gbara onwe ha akwụkwọ n'ụlọikpe dị n'Enugu ebe atụrụ Ben Nwoye onye bụ onyeisi oche pati ahụ n'Enugu steeti aka nakwa Okey Ezea onye zọrọ ọkwa Gọvanọ steetị ahụ mgbe ahụ maka okwu ha o mefụrụ ma kpachịe ego ruru nde nari naịra anọ.

Ezea gọrọ ebubo a mgbe ahụ ma bugara onyeisi oche pati ahụ na Naijiria mgbe ahụ bụ John Oyegun esemokwu ahụ.

Chetakwa n'otu afọ ahụ Ezea na Emma Eneukwu bụ osote onyeisi oche pati ahụ mgbe ahụ dọrọ onwe ha aka maka okwu nhazi ọkwa minista.

Ihe ndị a mere nakwa ihe ndị ọzọ mụnyere ọkụ na pati ahụ ruo oge a.

Na mbido afọ 2021, George Ogara bụ onye zọrọ ọkwa gọvanọ Enugu steeti n'okpuru pati APC zipụtara ozi na-ekwu na ha ekpeziela.

Mana ka ihe si gaa, ya bụ esemokwu mụbawanyere ruo ngwụcha afọ 2021 dịka otu pati ahụ kewapụrụ n'ụzọ dị ịcheịche.

Nkewapụ atọ pụtara n'ime otu a dịka ha niile chọrọ ọchịchị.

N'oge gara, ụfọdụ rụkwara ndị otu pati People's Democratic Party (PDP), ebe ekwuru na ha si na'ezi akpa nkata ọgbaghara na-ada pati APC mana ndị PDP kwuru na aka ha adịghị ya bụ ebubo.

Dịka otu pati APC mechara gba mbọ ikpezi udo, ihe a ndị oji egbe mere ha atụọla mmadụ niile n'anya.