APC Candidacy: Andy Uba agbagharịala akwụkwọ n'Ụlọikpe Mkpegharị

Mgbe e biputara ya

Onye fere ọkọlọtọ otu APC na ntụliaka gọvanọ Anambra steeti n'afọ 2021 bụ Senetọ Andy Uba agbagharịala akwụkwọ n'ụlọikpe mkpegharị.

Uba na-agbagha mkpebi ụlọikpe nke kwuru na ọ bụghị ya bụ onye nwetara ikike ife ọkọlọtọ APC na ntuliaka e mere na nsonso n'Anambara steeti.

N'akwụkwọ nke ọ gbagharịrị n'Ụlọikpe Mkpegharị dị n'Abuja nke bu akara :FHC/ABJ/CS/648/2021 Uba gbadọrọ ụkwụ n'ihe asatọ nke gụnyere; na ụlọikpe kpeburu ikpe ahụ enweghị ikike ịnụ ikpe ahụ nke ihe butere ya mere n'Anambara steeti.

"E mere ntuliaka imeụlọ n'Anambara steeti, ndị soro zọọ ya nọ maọbụ nwee mgbọrọgwụ n'Anambra steeti."

"E nwere Ụlọikpe Ukwu Etiti n'Anambara Steeti ebe ihe butere okwu mere mana onye wetara ikpe ebugaghị ya ebe ahụ."

Ụlọikpe ekpebiela na Andy Uba esoghi zọọ ọkwa Gọvanọ Anambara

Ọkaikpe Inyang Ekwo nke Ụlọikpe Ukwu nke dị n'Abuja akagbuola nsonye Sinetọ Andy Uba na ntuliaka e mere n'ụbọchị isii nke ọnwa Nọvemba e ji họpụta gọvanọ Anambara Steeti.

N'ikpe o kpere n'ụbọchị Mọnde, ọkaikpe a sị na onweghị oge Sinetọ Uba ritere ohere iji ọkọrọtọ patị All Progressive Congress n'ụzọ ziriezi.

Ọkaikpe Ekwo kwukwara na onye tinyere akwụkwọ banyere ikpe a bụ George Moghalu gosiri na patị APC emeghị ntuliaka imeụlọ dịka ha siri kwesi.

Ọkaikpe kwuru ka ngalaba na-ahụ maka ntuliaka bụ nke Bekee kpọrọ "Independent National Electoral Commission" (INEC) hichapụ aha Uba n'akwụkwọ ha ji denye aha ndị so mee ntuliaka ahụ.

Ha sịkwa ka patị APC nyeghachi maazị Moghalu nde narị iri abuọ na ụma ise o jiri kwuo na ya nwere mmasị iso zụọ ọkwa gọvanọ n'okpuru pati ahụ makana ha emeghi ntuliaka imeụlọ ziriezi.

Andy Uba na APC ga-arịọ mkpegharị

Otu a kpọrọ "The Senator Andy Uba Governorship Organisation" (SAUGCO) kwuru na ya na pati ya bụ APC ga-eje ụlọikpe were rịọ mkpegharị banyere mkpebi Ọkaikpe Ekwo.

N'akwụkwọ ozi BBC Igbo hụrụ Osote Onyeisi ha n'ihe banyere mgbasaozi bụ Ikechukwu Emeka Onyia binyere aka, otu ahụ sị ka ndị na-akwado ha kwanyere iwu ọha ugwu n'oge a.

Ha sịkwa na ha "hụrụ etu ndi na-akwado pati All Progressives Grand Alliance" (APGA) na-enwe aṅụrị maka mkpebi ụlọikpe a", mana ha si na ọ bu ezi ihe na ọbụghị sọsọ ụlọikpe a dị.

"Anyị na-aga ime mkpesa n'ụlọ ikpe mkpesa."