Isheagu Massacre: Etu ndị agha Naịjirịa si kpochapụ otu obodo dị na Delta Steeti n'oge agha Biafra
Mgbe e biputara ya
Mkpamkpa kpara na mpaghara Ọwụwa Anyanwụ Naịjirịa n'oge agha Biafra abụghị akụkọ a ga-akọcha akọcha.
N'ọtụtụ ebe ka ndị agha Naịjirịa kpochapụrụ ndị mmadụ na-abụghị ndị agha, n'agbanyeghị na agha ebiela oge ahụ.
'Asaba Masacre' bụ nke ọtụtụ mmadụ kacha anụ maka ya, mana ụdị ihe a mekwara n'Arochukwu nakwa ebe ndị ọzọ.
Ndị obodo Isheagu, nke dị n'okpuruọchịchị Anaocha na Delta Steeti, kọọrọ BBC Igbo etu ndị agha si kpochapụkwa ọtụtụ ndị be ha n'oge ahụEtu ndị agha Naịjirịa si kpochapụ ndị obodo Isheagu n'oge agha Biafra.
Ha kwuru na ha gụtara ihe karịrị mmadụ narị ise nke ụmụaka na ụmụnwaanyị esoghị na ya bụ ọnụọgụgụ.
Lee ihe onyonyo a ka ị hụ ihe mere ndị agha Naịjirịa ji wakpo ha oge ahụ.
Ndị mere akụkọ a bụ Vining Ogu na Chigozie Ohaka.





