Male Contraceptives: Ị ma ihe eji egbochi ịtụba nwaanyị ime nke ụmụnwoke dị n'Afrịka?

Ebe foto si, SIMON MAINA
A bịa n'ihe metụtara igbochi afọ ime na nwaanyị enwere ụzọ dị icheiche ụmụ nwoke nwere isi iji mee nke a.
Ụfọdụ bụ ndị a ma ama nwekwaa ndị ọzọ aka na-enyocha ma na-arụpụta. Ha gụnyere:
1. Okpu nnabuihe

Ebe foto si, Getty Images
Ọ bụ nke a ka akachasị mara ma bụrụkwa nke kachasị a rụ ọrụ ụmụnwoke ji egbochi afọ ime.
Ọ bụkwa naanị ya bụ ihe na-egbochi afọ ime ma na-egbochi kwa ọrịa mmekọrịta ndị ọzọ.
Mana ị ga-ehi asaa n'anya ka ịhụ ma oge ya agafeela nakwa na ọ dị n'ọnọdụ dị mma tupu iyiri ya.
Ọ na-arụ ọrụ pasentị 98.
2. Ịwepụ utu n'ike na mmekọrịta

Ebe foto si, Getty Images
Ụzọ a bụ ụzọ anaghị ewe ego ọbụla mana ọ naghị arụcha ọrụ mgbe niile.
Etu esi eme ya bụ nwoke iwepu utu ya na mmekọrịta tupu ọ nyụọ uhie.
Otu Dọkịnta bụ Moussa Diabete kọwara na ọ bụghị ụzọ ọ na-adụ ndị mmadụ ndọmọdụ ịme.
Ọ na-arụ ọrụ naanị pasentị 27.
3. "Vasectomy" maọbụ ịwa ahụ

Nke a bụ ịwa ahụ ma chabie akwara uhie na-esi siri n'akpa amụ abanye n'amụ.
Ịwa ahụ bụ ihe anaghị egbu oge dịka a na-emecha ya n'ime nkeji iri na ise.
Dịka ngalaba ahụike mba Briten bụ NHS si kwuo, ọ na-arụ ọrụ ihe ruru pasentị 99.
Ndị mmadụ na-eche na ọ bụ ihe ebighebi mana ọ bụkwa ihe enwereike ịme ntụgharị.
Kedụ etu ụmụnwoke si eme maka igbochi afọ ime n'Afrịka?

N'eziokwu, ọ bụghị ọtụtụ ụmụnwoke n'Afrịka na-eche uche iji ngwa mgbochi afọ ime.
Oge ụfọdụ ha na-ahapụkarị ya n'aka ụmụnwaanyị ka ha mee.
Dịka Dọkịnta Madina Ndoye si kọwa, ọ bụ maka ọzụzụ dị icheiche si n'okpukperechi nakwa omenala ka o jiri dị etu a.
Ihe ọzọ o kwuru butere nke a bụ n'ihi ọtụtụ mgbochi afọime emepụtara maka ụmụnwaanyị n'onwe ha.
Dọkịnta ọzọ tinyere ọnụ n'okwu a bụ Ndeye Khady Babou kwuru na tupu e nwee mgbanwe a ga-ebu ụzọ chee echieche maka ya.
Ọ sị "ndị mmadụ kwesiri ịjụ onwe ha ajụjụ ihe mere ejiri gbahapụ mgbochi afọ ime n'aka naanị ụmụnwaanyị".































