Male Contraceptives: Ị ma ihe eji egbochi ịtụba nwaanyị ime nke ụmụnwoke dị n'Afrịka?

Otu onye ọrụ Aids Healthcare Foundation-Kenya na-ere okpu nnabụihe n'okporụzọ isi obodo Nairobi. le 14 février 2014,

Ebe foto si, SIMON MAINA

Mgbe e biputara ya

A bịa n'ihe metụtara igbochi afọ ime na nwaanyị enwere ụzọ dị icheiche ụmụ nwoke nwere isi iji mee nke a.

Ụfọdụ bụ ndị a ma ama nwekwaa ndị ọzọ aka na-enyocha ma na-arụpụta. Ha gụnyere:

1. Okpu nnabuihe

Condom

Ebe foto si, Getty Images

Ọ bụ nke a ka akachasị mara ma bụrụkwa nke kachasị a rụ ọrụ ụmụnwoke ji egbochi afọ ime.

Ọ bụkwa naanị ya bụ ihe na-egbochi afọ ime ma na-egbochi kwa ọrịa mmekọrịta ndị ọzọ.

Mana ị ga-ehi asaa n'anya ka ịhụ ma oge ya agafeela nakwa na ọ dị n'ọnọdụ dị mma tupu iyiri ya.

Ọ na-arụ ọrụ pasentị 98.

2. Ịwepụ utu n'ike na mmekọrịta

Ndị na-eme mmekọrịta

Ebe foto si, Getty Images

Ụzọ a bụ ụzọ anaghị ewe ego ọbụla mana ọ naghị arụcha ọrụ mgbe niile.

Etu esi eme ya bụ nwoke iwepu utu ya na mmekọrịta tupu ọ nyụọ uhie.

Otu Dọkịnta bụ Moussa Diabete kọwara na ọ bụghị ụzọ ọ na-adụ ndị mmadụ ndọmọdụ ịme.

Ọ na-arụ ọrụ naanị pasentị 27.

3. "Vasectomy" maọbụ ịwa ahụ

Ndị dọkịnta mba Kenyan na-akwado ngwa ọrụ vasectomy

Nke a bụ ịwa ahụ ma chabie akwara uhie na-esi siri n'akpa amụ abanye n'amụ.

Ịwa ahụ bụ ihe anaghị egbu oge dịka a na-emecha ya n'ime nkeji iri na ise.

Dịka ngalaba ahụike mba Briten bụ NHS si kwuo, ọ na-arụ ọrụ ihe ruru pasentị 99.

Ndị mmadụ na-eche na ọ bụ ihe ebighebi mana ọ bụkwa ihe enwereike ịme ntụgharị.

Kedụ etu ụmụnwoke si eme maka igbochi afọ ime n'Afrịka?

Agaezi and her partner with their baby

N'eziokwu, ọ bụghị ọtụtụ ụmụnwoke n'Afrịka na-eche uche iji ngwa mgbochi afọ ime.

Oge ụfọdụ ha na-ahapụkarị ya n'aka ụmụnwaanyị ka ha mee.

Dịka Dọkịnta Madina Ndoye si kọwa, ọ bụ maka ọzụzụ dị icheiche si n'okpukperechi nakwa omenala ka o jiri dị etu a.

Ihe ọzọ o kwuru butere nke a bụ n'ihi ọtụtụ mgbochi afọime emepụtara maka ụmụnwaanyị n'onwe ha.

Dọkịnta ọzọ tinyere ọnụ n'okwu a bụ Ndeye Khady Babou kwuru na tupu e nwee mgbanwe a ga-ebu ụzọ chee echieche maka ya.

Ọ sị "ndị mmadụ kwesiri ịjụ onwe ha ajụjụ ihe mere ejiri gbahapụ mgbochi afọ ime n'aka naanị ụmụnwaanyị".