Joe Igbokwe akpọkuola ndị uweojii na ndị ọzọ maka etu 'Ipob si eyi ndụ ya egwu'

Ebe foto si, Joe Igbokwe
Onye bụbu ọnụ na-ekwuru otu pati All Progress Congress (APC) na Legọs Steeti bụ Maazị Joe Igbokwe ederela mkpesa banyere etu ọ sị ndi otu Indigenous People of Biafra (Ipob) sị eyi ndụ ya egwu.
Ọ bụ onyeisi ndị uweojii na Naịjirịa, onyeisi ndị uweojii n'Anambara Steeti, onyeisi ngalaba uweojii akpọrọ IRT, ndị gọvanọ ala Igbo, ndị omeiwu nakwa ndị ọnụ na-eru n'okwu n'ala Igbo ka o nyere mkpesa.
Na mmalite ozi a o tinyere n'akara Facebook ya, Maazị Igbo tụrụ ilu sị "Nne ọkụkọ sị na ya na-ebere ụwa akwa na egbe zuru nwa ya abụghị na ya agaghị emenwu ihe iji napụta ya nwa ya, mana ọ bụ ka ụwa nụrụ olu ya".
Ọ sị na ya ma n'eziokwu na mmadụ niile ma maka etu e si eyi ndụ ya na ndị ọzọ ekwenyeghị n'ebumnuche Ipob egwu.
Maazị Igbokwe sị na ugbua, "ndị Ipob anaghịzị atụ ụjọ ọbụla dịka ha na-eyi egwu, emekpa ahụ, emebi ihe ma na-emebi akụnaụba ala Igbo".
Ọ sị: "Ugbua, ndị a na-ekwu na ha nwere ike ọnwụ na ndụ n'ala Igbo."
Na nkọwa Maazị Igbokwe, "ndị kpuru isi ekwesighi idu ndị na-ahụ ụzọ", ọ kachasị ma ya bụrụ ndị amaghị ndị ha bụ maọbụ onye nna ha bụ na-ekwu na ọ bụ ha nwe ala Igbo".
Igbokwe sị na Maazị Ralph Uwazurike ji akọnuche lụọ ọgụ maka Biafra. Ọ sị na onweghị onye o gburu maọbụ kpọọ iyi.
Ọ sịkwa na Uwazurike akpaghi agwa ga-emebi akụnaụba ọha. "Onweghi onye ọ megidere."
Igbokwe gara n'ihu kwuo na ọnwụ na mmebisi ihe na-eso Nnamdi Kanu na ndị na-eso ya dịka ọ na-aju ebe ndị ọnụ na-eru n'okwu nọ: "Kedụ ndị Bishọp? Kedụ ihe mere ndị Gọvanọ ejighị ekwu okwu? Kedụ maka ndị ọkachamara na mahadum? Kedụ maka ndị oji ego achọ ego?"
Joe Igbokwe sị na ya kwenyere na o nwere ndị ọchịchi n'ala Igbo so ndị ọrụ nchekwa arụ ọrụ iji hụ na udo laghachitere na mpaghara ahụ.
Ọ sị na ụjọ ya na-atụ bụ na ndị Igbo nwereike kewaa abụọ, nke pụtara na a ga-enwe ọgbaghara n'etiti ndị na-akwado Naịjirịa na ndị na-akwado Biafra.
Joe Igbokwe sọ n'ime ndị ekwenyeghi n'etu ndị Ipob si achọ nwereonwe nke ga-enye ha mba Biafra.
Ebumnuche ya a na-ebutere ya na ndị Ipob esemokwu aghara aghara.






























