'Ihe mere Naịjirịa agaghị egbu maọbụ kpee Boko Haram chegharịrị ikpe'

Ndị Boko Haram

Ebe foto si, Nigerian Army

Mgbe e biputara ya

Mịnịsta mgbasa ozi bụ Lai Mohammed akọwala ihe mere gọọmentị Naijịrịa agaghị egbu maọbụ kpee ndị Boko Haram cheghariri ikpe.

Ọ bụ na mkparịtaụka ya na ụlọ ntaakụkọ News Agency of Nigeria (NAN) nwere n'ụbọchị Fraịdee na mba Amerịka ka Maazị Mohammed kwuru nke a.

Maazi Mohammed sị na usoro mba ụwa ji akpasị ndị agha chinyiri aka elu gbochiri Naịjirịa ịkpasị ndị a agwa agha.

O kwuru si: "Mụ na ndị ndu ọrụ nchekwa nwere mkparịụka tupu m mee njem a, ha gwara m na usoro a na-anbata ndị agha chinyiri aka elu bụ usoro mba ụwa hiwere maka ọnọdụ dị etu a."

Ọsịkwa: "Anaghị agbagbu ndị agha chinyiri aka elu n'ihi na iwu jịkọrọ mba uwa kwenyere n'ikike diri onye agbanyeghi ma onye ahụ abụ onye omekome agha."

O kwukwara si: "Ihe ndị ọrụ nchekwa na-eme ugbua bụ, mmadụị pụta si na ọ cheghrịala ma chinye aka elụ, ha ga-nyocha ya mara ma okwu a abụ eziokwu tupu ha anabata ya"

Ọ gakwara n'ihu katọọ ndị na-ekwu na ndị a anabatara abụghị ndị omekome Boko Haram na ezia.

O kwuru na ọ bụ ihe mgbawa obi ihụ na ndị mmadụ na-efesasi akụkọ ugha dị etu a.

Aha nkeananụānụ, Kanu:Ihe Lai Mohammed kwuru

N'okwu ya, ọ sị:

"Kama ikatọọ ọrụ a a na-arụ, ọ ka mma na-etiri Onyeisiala Bụhari na ndị ọrụ nchekwa aka n'obi dịka mmeri ha na-enwete na agha a, nke mpatara ya bụ ndị omekome Boko Haram na-echeghari ma achinye aka n'ike, n'ike"

Na nchịkọta, o gara n'ihu too onyeisiala maka etu o si nwee ntụkwasị obi na ndị agha Naijịrịa.