Eletronic Voting : Ọgbaghara adaala n'Ulọomeiwu Ukwu maka okwu 'electronic voting

Ụlọọrụ ndị Sineti Naịjiria

Ebe foto si, @NGRSenate

Mgbe e biputara ya

Esemokwu dapụtara n'Ụlọomeiwu Ukwu ụbọchị Tozde dịka ndị omeiwu na-adọrịta ụka maka ozi mpụtara si n'aka kọmiti ha hibere maka ịgbanwe Iwu Ntulika nke afọ 20210 nke Bekee kpọrọ Electoral Act No.6, 2010.

Mgbanwe iwu ahụ ga-emetụta ntuliaka nke Ọchịchị Etiti, steeti na okpuruọchịchị nakwa Isiobodo Naijiria bụ Abuja.

Ụfọdụ ndị senetọ(mmadụ 52) jụrụ Mpaghara iwu ahụ nke kwuru ka e jiri igwe okwu na-ezipu mpụtara ntuliaka. mana mmadụ 28 kwetara na ya, ebe mmadụ 28 abaghị.

Gịnị na-ese?

Ndị ụlọomeiwu

Ebe foto si, Nigerian Senate

Ụfọdụ ndị ụlọomeiwu kwetaburu ka e nye ngalaba na-ahazi mgbasaozi n'ekwenti bụ 'Nigerian Communications Commission'( NCC) ikike ịmalite were ekwentị ezipụ mpụtara ntuliaka.

Mana ụfọdụ jụrụ ajụ nke butere mba iwe.

Ọ bụ ka onyeisi Komịtị Seneti na-ahụ maka Inec bụ Seneto Kabiru Gaya(APC, Kano South) gụpụtachara mpụtara si kọmiti ya ka Senetọ Sabi Abdullahi(APC, Niger North) ka e dozie akụkụ nke 52(3) nke iwu ahụ.

Ihe dịbu na ya bụ mpaghara bụ "Komishọn nwere ike izipụ mpụtara ntuliaka sitere n'igwe eletọnic(ekwentị) oge na mgbe o nwerere ike."

Mana n'akwụkwọ nke Kọmitị ahụ gbanwere, ọ sịrị,"Komishọn nwere ike ilebanye anya na iji igwe eletrọnik zipụ mpụtara ntuliaka maọbụrụ na ngalaba na-ahazi mgbasaozi na'ekwentị ekweta na ọ bụ ozuru-Naijiria-ọnụ nakwa Ụlọomeiwu binye ya aka."

Mana mgbanwe ahụ adịghị ụfọdụ ndị senetọ mma dịka Senatọ Dickson Seriake (PDP, Bayelsa West).

Onyeisi Ụlọomeiwu Ukwu bụ Ahmed chọburu ikpọkọta okwu ọnụ jụ ndị kwere na mgbanwe niile komitị mere na ndị ekweghị, mana Senetọ James Manager jụrụ ajụ, sị ka a kpọpụta n'ahịrị n'ahịrị.

Ọgụ dara n'ụlọ omeiwu Nta

Ndị ụlọ omeiwu nta

Ebe foto si, Alamy

N'ụlọ omeiwu Nta, okwu gbasara iji igwe eletrọnic eziga mpụtara ntuliaka butere ọgbaaghara nke fọdụrụ ntakịrị ka ọgụ daa.

Oge ya bụ okwu malitere, onyeisi ndị omeiwu nta bụ Femi Gbajabiamila rituru n'oche ya gaa nọdụ n'oche ndị nkịtị, ebe osote ya bụ Idris Wase gara nọrọ n'oche iji kpebie ya bụ okwu.

Mana ụfọdụ ndị omeiwu achọghị ka e nye Inec ikike a, ebe ọtụtụ ndị ọzọ chọrọ.

Ndị ụlọ omeiwu nta

Ebe foto si, Channels TV

Nkọwa foto, Ọgbaaghara dara n'ụlọomeiwu nta n'ihi ntule iwu gbasara ntuliaka

Ọ kpọrọ oku ka ndị na-achọghị ka e nye INEC ikike tie mkpu 'aye', ka ndị chọrọ ka e nye ha ya bụ ikike tie mkpu 'nay'.

Ụda olu ndị chọrọ ka e nye Inec ya bụ ikike karịrị nke ndị achọghị, mana Idris Wase gara n'ihu kwuo na ọ bụ ndị achọghị ka e nye Inec ikike meriri.

Nke a butere nnukwu ọgbaaghara; ndị omeiwu biliri n'oche ha mkpọtụ na-ada n'elu n'ala.

Femi Gbajabiamila

Ebe foto si, House of Representatives/Facebook

Nkọwa foto, Onyeisi ụlọ omeiwu nta bụ Femi Gbajabiamila yigharịrị ọgbakọ ha ka ọ dịzie ụbọchị Fraịde.

Onweghịzị ihe ọbụla a na-ekwu nwere isi. Ndị omeiwu malitere ịkpọ onyeisi ha bụ Gbajabiamila ka ọ laghachi n'oche ya dịka 'Speaker'.

Oge Gbajabiamila laghachiri n'oche, o kpebiri na ha ga-agbasa ọgbakọ nke taa ma yigharịa ya echi bụ Fraịde.

O kwuru na ha ga-ezigara onyeisi Inec bụ Mahmood Yakubu ozi ka ọ bịa ọgbakọ ahụ bịa kọdoo ha anya.