Ka o si gaa: Ndigbo bi UK mere ngagharịiwe udo maka ndakpọ nchekwa Ọwụwa Anyanwụ

Ndị Igbo na-eme ngagharịiwe udo na Briten
Mgbe e biputara ya

Ndị Igbo bi na mba Briten pụtara n'igwe mee ngagharịiwe ha ji akpo oku n'ihi ihe gbasara ndakpọ nchekwa na mpaghara Ọwụwa Anyanwụ na Lọndọn ụbọchị Fraide.

Ụfọdụ ndị ahụ na-azọ ije ikpo oku udo jicha akwụkwọ na-ekwu ihe ndị bụ iwe.

Ihe ndị e dere n'akwụkwọ ndị ahụ gụnyere: "Ndụ ndị Igbo dị mkpa"; "Kwụsị mgbukpọ ndị Igbo n'Ọwụwa -Anyanwụ"; "Ọgbụgbụ ndị Fulani ọchiehi na-egbu ndị mmadụ n'Ọwụwa Anyanwụ ezuola"wdg.

Ndị Igbo na-eme ngagharịiwe udo na Briten

Ndị Igbo a bụ ndị si steeti dị iche iche n'Ọwụwa Anyanwụ Naijiria nakwa Anịọma gbakọrọ na 'Trafalgar Square' bụ ebe ha si zọrọ gaa n'ụlọ nnọchite anya Naijiria na Mba ahụ ebe ha siri gaa 10 Downing Street bụ obi gọọmentị mba Briten.

Ndị Igbo na-eme ngagharịiwe udo na Briten

Ha sikwara ebe ahụ gaa ụlọomeiwu ha bụ ebe ha nyere ha akwụkwọ mana e neyeghị ha ohere ịbanyere kama a gwara ha zite n'ụlọrụ post ofis zite akwụkwọ ozi ahụ.

Ndị Igbo na-eme ngagharịiwe udo na Briten

Otu n'ime onye ndu ndị ahụ mere ngagharịiwe ahụ bụ ọkaiwu Alex Ezemakam bụ onye wegahara akwụkwọ ozi ahụ kwuru na ngagarịiwe udo ahụ bụ iji gwa ụwa ihe na-eme n'Ọwụwa Naijiria.

Dr Nnanna Igwe
Nkọwa foto, Dr Nnanna Igwe, onyeisi Ohaneze n'UK na Ireland sị udo agbaala ọsọ na Naijiria

N'otu aka ahụ, Onyeisi Ohaneze na mba UK na Ireland bụ Dkta Nnanna Igwe kwuru na ihe mere ndị Igbo ji pụta n'ikem n'ikem bụ iji tikuo mba Briten, European Union, United Nation ka ha oku ka ha hụ ihe na-eme na Naijiria.

Ọ tụrụ arịrị na a na-egbusịsi ndị Igbo nakwa ndị okpukpere Kraistị ma kpoo oku ka gọọmentị weghachite udo.

Ndị Igbo na-eme ngagharịiwe udo na Briten

Ọ sịrị na ọ bụrụ na ngọọmentị achọghị iweta udo, ya hapụ ndị Igbo ka ha gawara onwe ha.

Onye ọzọ soro mee ngagharịwe bụ Ebere Ozo,, "Iwe na-ewe anyị ya mere anyị ji pụta ịkwụ ka a kwụsị igbu ụmụ anyị, ndị ndị anyị ọkachasị n'Ala Igbo."

"Anyị chọrọ ka mba Briten nyere anyị aka ka a kwụsị agwa ọjọọ a na-akpasa anyị na Naijiria."