Pharoah Okadigbo: Onye bụ nwoke a ụwa kpụ n'ọnụ ugbua?

Ebe foto si, godwinadogame/Instagram
Pharoah Okadigbo nwụrụ n'ihe mberede nke mere n'ụbọchi satọde bụ ụbọchi iri abụọ nke ọnwa Mee afọ 2021 n'Abuja.
Pharoah Okadigbo bụ nwa Chuba Wilberforce Okadigbo onye bụbu onyeisi ndị ụlọomeiwu ukwu Naịjiria site n'afọ 1999 ruo afọ 2000, dịka ọ nọchitere Anambara Nọt n'ụloomeiwu.
Nna Pharoah bụkwa osote Muhammadu Buhari oge ọ zọrọ ọkwa onyeisiala n'afọ 2003.
Dịka nna ya, Pharoah bụ onye obodo Umueri nke dị n'Ogbunike dị n'okpuruọchịchị Oyi nke Anambara steeti.
Pharoah bụ nwa ya nwoke nke atọ nke Ọkammụta Ikejiani Clarke mụụrụ Chuba Okadigbo.

Ebe foto si, @Akahenton/Twitter
O toro n'ogige mahadum Nsukka dịka nna ya bụ onye nkuzi na ya bụ mahadum oge ahụ.
Ọ gụrụ akwụkwọ na mahadum Naijirịa nke dị na Nsukka ebe ọ gụrụ maka ndọrọndọrọ ọchịchị.
Pharoah mechara gaa mba Ịngland ebe ọ gụru akwụkwọ were nweta asambodo ọkaibe n'ọmụmụ ndọrọndọrọ ọchịchi.
O tinyere aka n'azụmahịa dị iche iche nke gụnyere ọrụ ngo.
Ọ lụrụ nwaanyị ma mụtakwa ụmụ.





























