Abakiliki Rice Mill: Ihe mere ndị ọrụ osikapa ji mee ngagharịiwe n'Abakiliki

Ụlọahịa ebe a na-ere osikapa n'Abakiliki, Ebonyi steeti na-ewe iwe maka oke ụtụ isi gọọmentị steeti ahụ na-ana ha.
Nke a mere ha ji malite ngagharịiwe n'ụbọchị Tuzde nakwa Wenezde a iji kwuo na ya bụ ihe ezuola.
Ọnụ na-ekwuru ndị ahịa ahụ bụ Irem Bernard Obinna kwuru na ya bụ ihe malitere kamgbe onyeisi ọhụrụ aha ya bụ Samuel Ogodo bidoro ọchịchị.

Obinna kwuru sị: "Ọbụghị ntuliaka ka Samuel Ogodo ji bụrụ onyeisi ahịa anyị."
"Gọọmentị webatara ya dịka onyeisi nchereoge a kpọrọ 'caretaker chairman"
"Mana kamgbe afọ abụọ na ọkara, naanị ihe mgbu ka ọ na-ewetara anyị ebe a."
"Ụtụ isi ọ na-ana anyị ebe a karịrị akarị. Tupu mmadụ ebubata akpa osikapa ebe a, onye ahụ ga-akwụ naịra 250 maka otu akpa 50kg."
"Tupu onye ahụ ebupu otu akpa osikapa ebe a, onye ahụ ga-akwụ naịra 370."
Content is not available
View content on FacebookBBC anaghị ahụta maka ọdịnaya nke saịtị ndị dị na mpụga.sEnd of Facebook post
"O wepụtara akpa osikapa nke o tiri iwu na onye ọbụla ga-ejiriri na-etinye osikapa ya. Otu akpa ahụ bụ naịra 300, n'agbanyeghi na akpa ahụ esighị ike."
"O tiri iwu na ndị niile nwere igwe e ji esu osikapa ga-esiriri n'aka otu onye na-agbata mmanụ ha na-etinye n'igwe ha, mmanụ 'diesel' ahụ bụ adigboroja."
"Ọ na-anakọ ndị niile nwere ọdụahịa ebe naịra 500 kwa ọnwa nke ọ kpọrọ 'environmental levy'."
"Anyị amaghị ma Gọvanọ Dave Umahi ọ makwa maka ihe niile a na-emenụ, ya mere anyị ji eti mkpu."
BBC gbara mbọ ịnụ n'ọnụ Samuel Ogodo bụ onyeisi 'Abakiliki Rice Mill', mana o kwuru na ya enweghị ihe ọbụla ọ ga-ekwu.
Mana o mechara ziga ndị mmadụ ka ha gwa ndị ahụ na-eme ngagharịiwe okwu ma kwe nkwa na ha ga-eleba okwu ndị a anya.
































