Abakiliki Rice Mill: Ihe mere ndị ọrụ osikapa ji mee ngagharịiwe n'Abakiliki

Ndí ahía rice n'Abakiliki
Mgbe e biputara ya
Oge e ji agụ akụkọ nkeji 2

Ụlọahịa ebe a na-ere osikapa n'Abakiliki, Ebonyi steeti na-ewe iwe maka oke ụtụ isi gọọmentị steeti ahụ na-ana ha.

Nke a mere ha ji malite ngagharịiwe n'ụbọchị Tuzde nakwa Wenezde a iji kwuo na ya bụ ihe ezuola.

Ọnụ na-ekwuru ndị ahịa ahụ bụ Irem Bernard Obinna kwuru na ya bụ ihe malitere kamgbe onyeisi ọhụrụ aha ya bụ Samuel Ogodo bidoro ọchịchị.

Irem Bernard Obinna
Nkọwa foto, Irem Bernard Obinna bụ ọnụ na-ekwuru ndị 'Abakiliki Rice Mill

Obinna kwuru sị: "Ọbụghị ntuliaka ka Samuel Ogodo ji bụrụ onyeisi ahịa anyị."

"Gọọmentị webatara ya dịka onyeisi nchereoge a kpọrọ 'caretaker chairman"

"Mana kamgbe afọ abụọ na ọkara, naanị ihe mgbu ka ọ na-ewetara anyị ebe a."

Aha onyonyo, Rice economy: Ihe niile dị n'osikapa bara uru

"Ụtụ isi ọ na-ana anyị ebe a karịrị akarị. Tupu mmadụ ebubata akpa osikapa ebe a, onye ahụ ga-akwụ naịra 250 maka otu akpa 50kg."

"Tupu onye ahụ ebupu otu akpa osikapa ebe a, onye ahụ ga-akwụ naịra 370."

Skip Facebook post

Content is not available

View content on FacebookBBC anaghị ahụta maka ọdịnaya nke saịtị ndị dị na mpụga.s

End of Facebook post

"O wepụtara akpa osikapa nke o tiri iwu na onye ọbụla ga-ejiriri na-etinye osikapa ya. Otu akpa ahụ bụ naịra 300, n'agbanyeghi na akpa ahụ esighị ike."

"O tiri iwu na ndị niile nwere igwe e ji esu osikapa ga-esiriri n'aka otu onye na-agbata mmanụ ha na-etinye n'igwe ha, mmanụ 'diesel' ahụ bụ adigboroja."

"Ọ na-anakọ ndị niile nwere ọdụahịa ebe naịra 500 kwa ọnwa nke ọ kpọrọ 'environmental levy'."

"Anyị amaghị ma Gọvanọ Dave Umahi ọ makwa maka ihe niile a na-emenụ, ya mere anyị ji eti mkpu."

Aha onyonyo, Rice processing: Usoro e ji emepụta osikapa ọdịnala

BBC gbara mbọ ịnụ n'ọnụ Samuel Ogodo bụ onyeisi 'Abakiliki Rice Mill', mana o kwuru na ya enweghị ihe ọbụla ọ ga-ekwu.

Mana o mechara ziga ndị mmadụ ka ha gwa ndị ahụ na-eme ngagharịiwe okwu ma kwe nkwa na ha ga-eleba okwu ndị a anya.