Ibori Loot: Mba Naịjirịa ga-eji ego ha napụtara Ibori ruo akwa mmir Niger nke abụọ

James Ibori

Ebe foto si, Metropolitan Police

Nkọwa foto, James Ibori was jailed in 2012 for money-laundering offences
Mgbe e biputara ya

Mba UK na Naịjirịa ebinyela aka na nkwekọrịta iweghachita ego di nde Pound anọ na ụma abụọ bụ nke aweghachitere na aka-aka chiburu steeti Delta , James Ibori na ndi otu ya.

Nke a bụ nke mbụ ya mba UK n'ezitere Naịjirịa ego ha ezubetara na mba ha kamgbe abuọ a bianyere aka nkwekọrita na afọ 2016 gbasara ego ndi omekome zuru.

Ego ndi a eweghachitere ga abụ maka ịru ọrụ akụrụngwa eji akwalite ọnọdụ obibi ndụ tinyekwara okporoụzọ ndi gbapụtara ihe na Naịjirịa.

Gọọmenti Naịjirịa na mba UK nọrọ n'ụbọchị Tuzdee abali asatọ nke ọnwa machị binye aka na akwụkwọ nkwekọrita izitere ijeri naira abụọ nụma abụo bụ ego ezuruezu na Naịjirịa ma bubata na mba UK ebe a ga eji ya rụọ ọrụ ga abụ maka ọdimna ụmụ Naịjirịa.

Enwetara ego a n'aka gọvanọ chiburu steti delta steeti bụ James Ibori na ndi otu ya zuru, Site na enyemaka gọọemtị nke mba UK, ndi siri imi na ala ichuputa akụ di iche iche ezuru ezu esi na azụọlụ bubata mba ahụ.

N'ọnwa february afọ 2012, Ibori riọrọ arirịọ kwenye na aka ya adighi ọcha na ụlọikpe mba Uk site n'ebubo eboro ya izuru ego zupu mba ofesi, igba izu ọjọ,ime nrụrụ aka ego; ebe emechara tụọ ya nkpọrọ afọ iri na atọ.

Minister mba UK na ahụ maka okwu metutara Afrịka bụ James Duddridge kwuru;

"Mgbe ọbụla ezuru ego ọha, Ọ na ebi obodo ndi na anaghi ahụ tụrụ racha aka ọjọ, nke gosiri na agaghi ejikwa ego eme ihe mgbe ọdị na mkpa."