Ndị Ugwu e jidere n'Upper Iweka ha bụ ndị ole?

Fulani

Ebe foto si, Screengrab

Nkọwa foto, Mmadụ abụọ ahụ a hụrụ n'onyonyo bụ ndị e boro ebubo na ha bụ ndị oyi egwu
Mgbe e biputara ya

Akụkọ malitere ifesa na e jidere mmadụ abụọ ndị mpaghara Ugwu n'Upper Iweka n'ụbọchị Wenezde.

Olu na-agbasa akụkọ ahụ na-ekwu na ndị ahụ bụ ndị oyiindụegwu, ma gosikwa egbe na mma a natara ha.

Aha onyonyo, Fulani herdsmen in Bende:"Ndị uweojii kpọchịrị anyị mgbe anyị gara ikpesa etu ndị ọchịehi si mebie n'ugbo anyị"

Ndị ugwu abụọ ndị ahụ e nwetara n'ọdọụgbọala Chisco bụ ndị dinta na-agara onwe ha - Haruna Mohammed

Mana Haruna Mohammed bụ ọnụ na-ekwuru ndị uweojii n'Anambara steeti gawara BBC Igbo na mmadụ abụọ ahụ bụ ndị dinta na-agara onwe ha.

Na nkọwa ya, Mohammed kwuru na ya bụ ihe mere n'ụbọchị Sọnde 21 Febụwarị, 2021, ọ bụghị ụbọchị Wenezde dịka akụkọ si agbasa.

Mohammed kwuru na ndị ahụ bụ ndị dinta na-aga izute ndị otu ha tupu ejide ha.

Ọ gara n'ihu kwuo na ndị uweojii mechara zọpụta mmadụ abụọ ahụ.

Udo dị n'Upper Iweka ugbua - Onye nlekọta ọdọụgbọala Chisco

Iji mata etu ihe si kwụrụ n'Upper Iweka ugbua, BBC Igbo kpọtụụrụ otu onye na-elekọta otu ọdọ ụgbọala n'Upper Iweka, o wee kwuo na udo adịla ebe ahụ ugbua.

Nwoke a na-achọghị ka a kpọọ aha ya gwara BBC Igbo na ọ nọghị ya oge e jidere mmadụ abụọ ahụ mana ọ nụrụ ya n'akụkọ.

Aha onyonyo, Don Adinuba maka ndị ọchịehi Fulani.

O kwukwara na ọ bụ na mpaghara Upper Iweka a na-akpọ 'Abuja Park' ka akụkọ kwuru na ya bụ ihe mere.

Ọ gara n'ihu kwuo na ndị uweojii na-akpagharị na mpaghara Upper Iweka niile iji hụ na ebe niile dị jụụ