Ihe ise di ọkpụrụkpụ n'ozi Onyeisiala Buhari ziri ndị Naịjirịa na mbido afọ 2021

Ebe foto si, Getty Images
Dịka a na-eme mbụ, Onyeisiala Naịjirịa bụ Muhammadu Buhari ziri ndị Naịjirịa ozi afọ ọhụrụ.
Na mbido o kwuur na afo 2020 siri ezigbote ike mana ya na-ekele Chukwu maka inye ndị mmadu ohere ịhụ afo ọhụrụ, ọkachasị dịka mkpa mkpa covid-19 ka na-aga n'ihu.
Ọ sị na 2020 butere ọnụnwa nye Naịjirịa n'ụzọ dị iche iche ma si ka echeta ndị lara mụọ na ya bụ afọ.
Mana lee ihe di ọkpụrụkpụ ị ga-achọ ịmata n'ozi na nkenke:
1: Naịjirịa ka kwụ chịm n'agbanyeghi na ọ gbaala afọ 61
Buhari sị na ọ bụ n'afo 2020 ka Naịjirịa ruru afọ 60 kemgbe o nwetere nwere onwe n'aka Briten. Ọ si dịka ọ na-abanye afọ 61 na Naịjirịa ka bụkwa mba ụwa na asọpụrụ.
Buhari sị: "Ọtụtụ mmadụ nọ na Naịjirịa nakwa mba ndỊ ọzọ ekweghi na mba ahụ nwereike bụru ihe ọ bụ taa, mana ọ ka kwụsị ike, na-agba mbọ ịga n'ihu ebe ndị ọzọ na-ada."
2: Ana m ekweghari Naịjirịa nkwa
Buhari sị na ya kwegburu ndị Naịjirịa nkwa n'afọ 2020 dika mkpa mkpa covid-19 malitere nsogbu ya, ugbua, ọ sị na ya na-ekwekwa nkwa ahụ ọzọ.
Ọ sị na uche ya di na ndị ntoroọbịa bụ ndi chọrọ enyeamaka. Ọ sị: "N'ichekwa mba a, anyi kwesiri ịchekwa echi maka ndị ntoroọbịa."
Buhari si na ndị ntoroọbịa bụ akụnaụba kachas mkpa Naịjirịa nwere ma n'ezi ma n'ụlọ.
3: Maka nchekwa Naịjirịa
Buahri sị na nchekwa so n'ihe kachasi mkpa gọọmentị ya ga-etinye uche na ya.
Ọ sị na ya ga-agbanyere ndị ọrụ nchekwa ukwu nke a ga-eji hazigharịa ha. Nke a ga-emetụta ndị agha na ndị uweojii iji hu na ha nwere ike ha ji ebuso ndi omekome agha na mpaghara Naịjirịa dịiche iche.
O metukwa ọnụ na ntụghapụ e mere ụmụakwụkwọ Kankara n'aka ndị ntọrị.
4: A na m agba mbọ maka ịkwalite akụnaụba Naịjirịa
Buhari sị na gọọmentị ya na-agba mbọ ịkwalite akụnauba Naịjirịa site n'itinye uche na-ịchọ atumatu ndi ọzọ Naịjirịa ga-esi na-akpata ego nke na-abụghị mmanụ agbịdị.
Ọ si na nke a nyere aka maka ịkọpụta nri.
Ọ sịkwa na ha na-arụ okporo ụzọ, ụzọ ụgbọ oloko, akwa mmiri, ọdọ ụgbọelu nakwa ndị ụgbọ mmiri.
5: Agha mpu na nrụrụaka
Onyeisiala Buhari sị gọọmentị ya eritela uru na-agha ha na-ebuso mpụ na nrụrụaka na Naịjirịa.
Ọ sị na ha na ndi omeiwu na-arụkọ iji hibe iwu ọhụrụ nakwa kwalite nke dibu ga-enye agha a ha na-ebuso mpụ ịmịta mkpuru karịa etu ọ mịtara ugbua.
Ọ si na ya ma na gọọmentị ya anaghi eme ọsịsọ dịka ọtụtụ mmadụ chọrọ, mana ka na lee anyị n'etu ihe di tupu ọ bata na ngwa ọgụ ha ji aga ọgụ.




























