Tyler Perry: O nwere ihe o mere ma dimkpa karịa afọ iri ise ma ọ lụbeghị nwaanyị?

Tyler Perry

Ebe foto si, Getty Images

Mgbe e biputara ya

Tyler Perry bụ onye ejije mba Amerịka ama ama. I lee ya anya, ọ ga-adị ka ụwa zuuru ya oke n'ihi na o nwere ego nke ọma.

Ụlọ ntaakụkọ Forbes gụpụtara ya n'afọ 2011 dịka onye a kachasị akwụta ego n'ihe gbasaara ịkpa obi oma dịka o nwetara nde dọla otu narị na iri atọ ($130 million) n'agbata afọ 2010 na 2011.

Mana o riri ụwa ọnụ dịka o mepere mbara ọnụ ya ụbọchị Tọzde were kwụpụta na obi adịghị ya mma n'ihi na owu na-ada ya dịka ọ gbara afọ 51 ka bụrụ okokporo.

"Ihe nke a bụ etu ọdachị etiti ndụ na-adị. Adị m afọ iri ise na otu, abụ m okokporo ma na-atụ uche etu echi m ga-adị.

"Etu ọbụla o si dị, aga m na-eso Chukwu, gbaa mbọ bụrụ ezi nna na nwoke, welite isi elu ma na-agba mbọ ka m nwere ike."

Ihe Tyler Perry kwuru

Ebe foto si, Tyler Perry/Facebook

Okwu ya ahụ ghọrọ ọtụtụ ndị mmadụ ọgbaraIgbogharịị nke mere aha ji wuwe na soshal midia- Ogaranya iri ehi, onye ụwa nile na-anụ aha ya na-ekwu na obi adịghị ya mma n'ihi na ya bụ okpokoro n'afọ 51?

Tupu i chewa ihe ọzọ, ka anyị tụnyetụ gị azụ maka Perry:

N'ezie na Perry bụ okpokoro ugbua dịka o si gbaa n'ama, mana ọ bụ okokporo ji nwa.

Nwaanyị bụ onye ụtọ ya kemgbe 2012 aha ya bụ Gelila Bekele mụtara ya nwa ha bara Aman n'afọ 2014.

Tyler Perry na onye ụtọ ya bụ Gelila Bekele

Ebe foto si, D Dipasupil/Getty

Nkọwa foto, Tyler Perry na onye ụtọ ya bụ Gelila Bekele ji otu nwa

Onye ejije a mepụtara agwa 'Madea' nke bụ agadị nwaanyị kpọrọ akpọ ka achịcha n'ihe onyonyo o mepụtarala, Perry emeela ọtụtụ ihe ejije nke o ji ụfọdụ n'ime ha nweta nturuugo ma kpatakwanụ ezigbo ego, nwee ụlọ ebe dị iche iche na ihe ndị ọzọ.

Perry bụ ọgaranya taa, mana mbido ndụ ya bụ ndụ ahụhụ.

Ije ụwa bụbu ije anya mmiri na ahụ ụfụ; ezinaụlọ ya bụ ndị ogbenye.

Nna ya na-akụ ya ihe tinka kụrụ panụ, ebe mgbaba ya mgbe ọ na-etolite bụ ụlọụka nke nne ya na-akpọ ya aga.

Ọ bụkwa onye e metọrọ ugboro ugboro oge ọ dị obere.

Ahụhụ na ụbịam ekweghị ya gụchaa akwụkwọ mana ọ zara mmadụ dịka o wulitere onwe ya site ime ejije.

Tyler Perry

Ebe foto si, Michael Tran/Getty

Ọ bụ n'okenye ya, oge o mere nnyocha 'DNA' ka Perry onye aha ya bụbu Emmirt Perry Jr. tupu ọ zagharịa aha jiri mata na Emmit Perry o cheburu bụ nna ya abụghị onye mụrụ ya.

Nne Perry bụ Willie Maxine Perry nwụrụ n'afọ 2009 ka ọ rịachara ọrịa.

O nwere ihe o mere ma dimkpa karịa afọ iri ise ma ọ lụbeghị nwaanyị?

Nwoke na-agwa nwaanyị okwu

Ebe foto si, Getty Images

Ndị mmadụ na-ahụta Perry dịka onye ụwa zuru oke, nke bụ na o nweghị ihe kwesịrị iji ya ịlụ nwaanyị mana ọ lụbeghị.

Dịka ndị ọkachamara ahụike ahụ na nke obi si kwuo ọ dịghị mma nwoke ịbụ ọgbọ Perry ghara inwe nwaanyị.

Ha kwuru na a na-ewe nwoke ruru afọ iri anọ gbagowe ma ọ lụbeghị nwaanyị dịka 'ofeke' maọbụ 'efulefu' ma na-akpasokwa ya agwa dịwara aṅaa.

Ha kwuru na nke a nwere ike ibutere ya nsogbu ahụike ahụ maọbụ nke uche.

Dkta Joseph Akinde bụ dọkịta ahụike sị," Ọ bụrụ na nwoke ahụ abụghị onye a pịrị amụ maọbụ onye agaghị atụwali nwaanyị ime, o nwere ka ọ dị ma ọ bụrụ na o ruru afọ iri anọ ma ọ lụbeghị nwaanyị."

"Nwoke alụghị nwaanyị a na-ewe ya dịka ofeke, o zughị ezu."

" Ọ bụrụ na inweghị nwaanyị, ọ ga-eme gị ka inwe obi ịda mba."

Akinde kwuru na "nke a nwere ike ibutere gị ọrịa dịka ọrịa shuga, ọbaramgbalielu, ọrịa mmụọịdamba(depression)."

N'otu aka ahụ, dọkịta uche bụ Dkta Afolabi Ayorewu nke Mahadum 'University of Lagos' kwuru na nwoke ruru afọ iri ise enweghị nwunye a na-ahụ ya dịka 'efulefu'.

" Enweghị nwaanyị nwere ike ime ka inye ya ọkwa kwa ya. A na-ahụ ya na inwe nwunye gosiri na ị gaghị akpa agwa dịwara aṅaa."

Dkta Ayorewu kwuru na ọ bụrụ na awọ gị oke gị n'ọkwa itozuru n'ihi na ịlụbeghị nwaanyị, ọ ga-agbarụ gị obi, mee gị ka ibido na-eleda onwe gị anya nke nwere ike ibutekwara gị nsogbu uche."

Gịnị bụdị 'midlife crisis' Tyler Perry na-ekwu maka ya?

Ụmụnwoke agbarala ọkara ndụ

Ebe foto si, Getty Images

Nke a bụ ịda mba n'ume na-emekarị ụmụnwoke dị agbata afọ iri anọ na ise na afọ iri ise.

Dịka Ayorewu, ọ bụrụ na imechaa ihe ị na-eme na ndụ, ị gụọla akwụkwọ na-arụ ọrụ, i toruola n'isi n'ọrụ gị, o nweghịkwa ihe ọzọ ị na-eleghara anya ị chọrọ ime, ị ga-ebido dawa mba n'ume nke a bụ ihe Bekee na-akpọ 'Midlife crisis".

Aha onyonyo, Say No To Rape: 'Etu ụmụagbọghọ si dinaa m n'ike mgbe m dị afọ ise'

"O nwere ike ime gị obi nkoropụ."

Dkta Akinde kwuru na 'midlife crisis' "nwere ike ime nwoke o nwee nsogbu utu ekelighị ekeli, enweghị agụụ ya na nwaanyị ịnọkọ nakwa atụwalighị nwaanyị ime".

Ihe ị ga-eme maka 'midlife crisis'

Dkta Afolabi Aroyewu nyere ndụmọdụ ka nwoke na-agabiga nsogbu agbata ọkara ndụ (midlife crisis) nyere onwe ya aka site n'ime ihe ndị a:

  • Gbanwee ụdị ọrụ ị na-arụ
  • Bido ọrụ ebere nke Bekee kpọrọ 'charities'mgbe
  • Na-enye aka bulite mmụọ onye ahụ
  • Mmekọrịta mmadụ na ibe ya dị mkpa- Gba mbọ ka ndị gị na ha dị na mma na ịgbahapụghị ha oge ị na-achụ uto n'ọrụ gị.

Akụkọ ndị ga-amasị gị: