Ghana Election Results: Mpụtara ntuliaka ọkwa onyeisiala Ghana 2020

Mgbe e biputara ya

Mba Ghana ga-amata mpụtara ntuliaka ọkwa onyeisiala ha taa dịka ndị Ghana ruru nde iri asaa tụrụ vootu ịhọpụta onyeisiala na ndị ụlọomeiwu ọhụrụ.

Ghana live map key

Ntuliaka a ga-adị n'ọgbọ ntuliaka karịrị puku 38 na mpaghara iri na isii pejupụtara mba Gana.

Jean Mensa bụ nwaanyị na-ahazi ntuliaka adọọla ndị pati nakwa ndị ntaakụkọ aka na ntị ka ha ghara ịkpọpụta mpụtara ntuliaka.

Ọ sị na ọ bụ ha ka ọ dị n'aka ịkpọpụta ya n'ime otu ụbọchị e mechaara ebinyechara aka.

Akara ntụ-ntụ

Ka ọ dị ugbua ntuliaka emechiela n'ọgbọ a ntuliaka nke Ghana.

Onye ọbụla chị aka ịghọrọ mpụtara ntuliaka e mere n'ọgbọ ntuliaka dị na mpaghara 16.

Ndí uweojii na mba Ghana awuchiela ndị ọrụ so agụ ntuliaka n'ihi ebubo nrụrụaka n'Awutu Senya West na Bawku Sentral.

Ndị uweojii na Ghana ekwuola na mmadụ abụọ ka agbara egbe n'Awutu Senya East.

Onyeisiala Ghana bụ Nana Akufo-Addo akpọkọọla ndị mmadụ ka ha na-echekwa onwe ha kama ịkpa mkpamkpa.

Ndị ọrụ nhazi ntuliaka na Ghana sị na n'ime otu ụbọchị (elekere 24) ka ha ga-akpọpụta mpụtara ya.