Ndị tụrụ ogbunigwe n'ụlọọụka nna Nyesom Wike ha bụ ndị otu IPOB?

Ndị e boro ebubo ịtụ ogbunigwe n'ụlọọụka nna Nyesom Wike

Ebe foto si, Rivers State Police

Nkọwa foto, Ndị e boro ebubo ịtụ ogbunigwe n'ụlọọụka nna Nyesom Wike
Mgbe e biputara ya

Ọkaiwu ndị otu 'Indigenous People of Biafra' bụ Alloy Ejimakor ekwuola na mmadụ atọ ndị uweojii gbara n'anwụ maka ịtụ ogbunigwe n'otu ụlọụka na Port-Harcourt, abụghị ndị otu IPOB.

Ndị uweojii gbara mmadụ atọ n'anwụ n'ụbọchị Tọzde ma kwuo na ha sara asịsa na ha bụ ndị Ipob.

Aha mmadụ atọ a bụ: Progress Owudinjo, onye Etche, dị na Rivers Steetị; Apuro Victor, onye Ebonyi Steetị, na John Okorie, onye Abia Steetị.

Ndị uweojii kwuru na mmadụ atọ ahụ sara asịsa ma kwuo na ihe ha ji mee ya bụ ihe a bụ iji gbagote n'ọkwa n'otu IPOB.

Ndị ahụ kwukwara na ebumnobi ha abụghị igbu onye ọbụla, ya kpatara ha ji were abalị gaa ya bụ ije.

Ihe IPOB kwuru

Ejimako Alloy
Nkọwa foto, Aloy Ejimakor bụ ọkaiwu ndị Ipob na onyeisi ha bụ Nnamdi Kanu

Alloy Ejimakor bụ ọkaiwu Ipob gwara BBC Igbo na "ọ bụ ebubo ụgha ka gọọmentị Rivers na ndị uweojii na-ebo Ipob".

"Ndị ahụ ndị uweojii gbara n'anwụ abụghị ndị Ipob."

"Ọ bụrụ na ha bụ ndị Ipob, ndị otu ahụ agaghị agbahapụ ha. Ipob anaghị agbahapụ ndị otu ha."

"Ipob abụghị otu na-achọ ọgbaaghara, ha bụ otu udo. Ha amaghị etu e si arụpụta ogbunigwe."

"O doro anya na ndị na-arụ ogbunigwe na Naịjirịa bụ ndị Boko Haram na ISWAP."

Ndị e boro ebubo ịtụ ogbunigwe n'ụlọọụka nna Nyesom Wike

Ebe foto si, Ndí uweojii Rivers State

Nkọwa foto, Ndị e boro ebubo ịtụ ogbunigwe n'ụlọọụka nna Nyesom Wike

Ejimakor gara n'ihu kwuo na o kwesịghị ekwesị n'iwu etu ndị uweojii si akpụpụta ndị mmadụ gbaa ha n'anwụ n'ihi ebubo na ha kpara arụ.

"Ọ bụ naanị ụlọikpe nwere ikike ikwu ma mmadụ ọ dara iwu maọbụ ọdaghị iwu, ọ bụghị ndị uweojii."

Ihe ndị uweojii kwuru

Onyeisi ndị uweojii nke Rivers State

Ebe foto si, River State Police

Nkọwa foto, Onyeisi ndị uweojii nke Rivers State Joseph Mukan

N'okwu ya oge ha na-agba mmadụ atọ ahụ n'anwụ, onyeisi ndị uweojii Rivers steei bụ Joseph Mukan, kọwara na ha nwetara ozi na ndị ekperima wakporo ụlọụka a kpọrọ 'Christian Universal Church' nke dị n'Azikiwe Road na Portharcourt.

Oge ha rutere ebe ahụ, ndị nche ogbe ahụ ejidela mmadụ atọ n'ime mmadụ isii ha kwuru mere ya bụ ihe.

Ndị nche ahụ hafere mmadụ atọ ahụ ha jidere n'aka ndị uweojii.

Mukan gara n'ihu kwuo na ha ka na-achọ mmadụ atọ ndị ọzọ gbara ọsọ, nakwa ndị zipuru ha ya bụ ije.

BBC Igbo kpọrọ ọnụ na-ekwuru ndị uweojii Rivers bụ Nnamdi Omoni, ka ọ kọwaa nke ọma ihe gbasra akụkọ a, mana ọ zaghị ekwentị ya.

Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị:

Ihe nkiri ga-amasị gị:

Aha onyonyo, Ihe mere m ji eji ọnụ, ụkwụ, ntị n'akụkụ ahụ m ndị ọsọ ese ihe