Femi Gbajabiamila: Kedụ ọghọm dị na ịgbalị egbe elu?

Gun salute

Ebe foto si, Getty Images

Mgbe e biputara ya
Oge e ji agụ akụkọ nkeji 2

Onyeisi ndị Omeiwu Oeble na Naịjirịa bụ Femi Gbajabiamila ekwuola na onye uweojii so ya aga njem gbara egbe n'elu gburu onye na-ere akwụkwọ ntaakụkọ.

Nke a na-abịa dịka okwu ka na-ada maka ebubo na ndị agha gburu ndị na-eme nagharịiwe EndSARS na ebe a na-anata ụtụisi ụgbọala na Lekki dị na Legọs.

Gbajabiamila kwuru na ọ bụ ka ndị uweojii na-eche ya nche na-eme ka ha chụpụ ndị nọchiri ụgbọala ụzọ ka ha gbalili egbe elu.

Mgbọ egbe ahu tụrụ otu onye na-ere akwụkwọ akụkọ n'isi were gbuo ya.

Skip X post
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: Third party content may contain adverts

End of X post

N'agbanyeghị na Gbajabiamila ekwuola na amlitela nyocha ihe a mere, ndị mmadụ na-aju etu egbe agalili elu ga-esi gbuo mmadụ.

Egbe agbalili elu ọ ga-egbunwu mmadụ?

N'afọ 2011, BBC mere akụkọ banyere ihe a site na inyocha etu ịgbali egbe elu nwereike si meruọ ahu maọbụ gbuo mmadụ.

Akụkọ ahụ si na ịgbali egbe elu na egbu mmadụ ma merụọ mmadụ ahụ kwamgbe.

David Dyson bụ onye ọkachamara n'ihe banyere njem mgbọ egbe a gbara sị; "Mgbọ egbe ndị a na-arị elu ọfụma ma agba ha. Mana, ị maghị ebe ha ga-ada - ohere na-adịrịrị na ha gba emerụ mmadụ ezigbote ahụ maọbụ gboo onye ahụ."

Akaebe ebe ụdịrị ihe a na-eme

Na mba Filipines, mmadụ atọ nwụrụ dịka a gbara egbe ji nabata afọ ọhụrụ n'afọ 2011.

Na 2010, otu onye na-agba akwụkwọ na mba Tọki gburu mmadụ atọ n'ezinaụlọ ya dịka ọ gbara egbe AK-47.

N'otu afọ ahụ Eze na-achị Jọdan bụ Abdullah II nyere iwu ka anwụchie onye ọbụla gbalili egbe elu dịka mmadụ abụọ nwụrụ ebe mmadụ 13 ọzọ merụrụ ahụ n'ebe ndị na-enwe anwụrụ na-agbali egbe elu.

Ka otu egwuruegwu Iraq meriri nke Vietnam n'afọ 2007, mmadụ atọ nwụrụ na Bagdad dịka ndi mmadu na-agali egbe elu agharagha.

Ka alụchara agha Gulf n'afọ 1991, egbe ndi mmadụ gbara ka a na-enwe aṅụrị gburu ihe ruru mmadụ 20.

Na mba Amerịka, nyocha chọpụtara na mgbo si n'elu daa tụrụ mmadụ 118 site 1985 ruo 1992. MMadụ 38 n'ime ndị a nwụrụ.

Kedụ ihe mere mgbo a gbalili elu ji egbunwu mmadụ?

Nyocha na-akọwa na agbanyeghị na ọsọ mgbọ ji ada erughi nke o ji akpụ n'egbe mana ọ ka na-agasi ike nke igbu mmadụ.

Dịka nyocha e mere na 1962 siri kwuo, mgbọ akpọrọ ".30 calibre" na-eru ọsọ ruur ihe Bekee kpọrọ "300 feet (91m) per second" dịka ha na-ada.Mgbo na-aga "200 feet (61m) per second" zuru ịba isi mmadụ.

Nke a pụtara na ọsọ mgbọ .32 calibre ji ada zuru imerụ mmadụ ahụ maọbụ gbuo mmadụ.

Na steeti Kalifọna, Texas, Arizona na Ohio, iwu machiri ịgbalị egbe elu.

Na Minisota, a machiri na n'ebe a na-eli mmadụ.

Ọkamụta ihe banyere omenala egbe bụ Peter Squires kpebiri sị na "ihe rịri elu ga-adarịrị."