You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
Covid-19: Ike Rice, iwe mmadụ puku 774 n'ọrụ na ihe ndị ọzọ gọọmentị chọrọ imere Naịjirịa
Dịka Onyeisiala Naịjiria bụ Muhammadu Buhari nyere ikike ka ewepụta ijeri narị naira ise (N500B) iji nyere aka maka mwakpo ọrịa coronavirus.
Ọ bụ Zainab Ahmed bụ Minista na-ahụ ka a Ego, Bọọjetị nakwa nhazi kwuru nke a dịka o kwuputara atụmatụ a ga-eji hazie akụnụba Naijrịa dịka covid-19 na-anyụ ụwa ịkpakwụ nke Bekee kpọrọ "Fiscal Stimulus Measures".
Kedụ ebe gọọmenti ga-esi wepụta ya bụ ego mgbapụta?
Gọọmenti kọwara na ọ bụ site na ọba ego dị iche iche gọọmenti nwere ka ha ga-esi esepụta ya bụ ego.
Akwụkwọ a kwukwara na ndị ụlọomeiwu ụkwụ ka eso dịka ndị na-ahụ na ya bụ atụmatụ gara nke ọma.
Mkpebi ọzọ bụ na gọọmentị Naịjirịa ga-ebute ego n'aka World Bank, AfDb, IDB na ndị ọzọ.
Etu ego mmbubu si kwụrụ bụ:
- Nde dọla 82 n'aka World Bank a ga-enye NCDC
- Nde dọla 6.9 n'aka IMF, World Bank na AfDB.
Kedụ etu gọọmenti ga-esi mefuo ya bụ ego mgbapụta?
Lee ihe anọ I kwesịrị ị ma maka ya bụ ego mgbapụta dịka akwụkwọ ngalaba gọọmenti na-ahụ maka akụnụba nke onyeisi ha bụ Zainab Ahmed depụtara maka nke a.
1)Ahụike:
Otu ihe bụ inye ntị steeti enyemaka Bekee kpọrọ Fiscal Support.
Dịka ngalaba Onyeisiala Buhari hiwere maka ọrịa coronavirus nke a kpọrọ "Presidential Task Force on Covid-19 " chọpụtara na nyocha ha na ọ dị mkpa ka ebulite agurungwa ụlọ ọgwụ na
Naịjirịa, ụfọdụ ego mgbapụta a ga-agara ụlọ ọgwụ ndị dị na steeti dị na Naịjiria iji wulite akụrụngwa ha maka ọrịa corona virus.
2)Ego e nyem aka nke steeti:
Ọzọkwa bụ ijeri naịra 102.5 ewepụtala maka ahụịke nke gọọmentị etiti na nke steeti so nwere.
Ọ bụ kwa site n'ego mgbapụta a ka gọọmenti ga-esi nyere steeti niile nọ na Naijiria aka iji wulite ngalaba ahụike ha dị iche iche maka ọgwụgwọ ọrịa coronavirus.
3) Iwe ndị ọrụ gọọmenti 774:
Dịka onyeisiala Naijiria bụ Muhammad Buhari nyere ikike ka-ebido atụmatụ iwe mmadụ narị puku asaa, iri asaa na anọ (774,000) n'ọrụ gọọmenti pụrụ iche iji nyere aka beleta mwakpo ọrịa coronavirus wakporo akụnụba ndị Naijiria.
Ọ bụ site n'ego mgbapụta a ka gọọmenti ga-esi hiwe atụmatụ a. Gọọmenti ga-esi na ego mgbapụta a wepụta naira ijeri iri isii (N60B) maka ụgwọ ọrụ ndị a na ihe ndị ọzọ gbasatara ya bụ atụmatụ. Atụmatụ a ga-ebido na steeti niile dị na Naijiria site n'ọnwa Oktoba ruo Disemba.
4) Ike nri edebere nakwa osikapa ndị Custom nwuchiri:
Enyere ngalaba Customs iwu ka ha kesaa ụmụ Naijiria osikapa ndị ha jichiri n'aka ndị na-ezobata ya.
Nke a bụ ụzọ ọzọ gọọmentị Naijiria ji ebelata ntaramahụhụ dapụtara n'ihi ọnọdụ nọrọ n'ụlọ a manyere maka ọrịa Coronavirus.
5) Nchabi ogogo etinyeburu bọọjetị 2020:
Ihe ọzọ Onyeisiala Buhari katụru aka bụ ihazieghari etu ego mmanụ agbịdi siri metuta bọọjetị nke 2020 nke Bekee kpọrọ "Budget Benchemarks".
Ego ọzọ fọrọ ga-abụ ego gọọmenti ga-ejide n'aka ma ọ bụrụ na enwere atụmatụ ọzọ gọọmenti ga-ewepụta maka iluso ọrịa coronavirus ọgụ.