Onyeisi ndị ntorobịa pati APC Enugwu enwerela onwe ya
Onyeisioche otu Pati APC n'Enugwu state bụ Ben Nwoye ekwuola na onyeisi ndị ntorobịa Pati ahụ bụ onye ndị uweojii nwụchiburu, enwerela onwe ya.
Ben Nwoye kwuru na nwa amadị a aha ya bụ James Nwanjoku Okugo nweere onwe ya n'ụbọchị Tuzde, abalị asaa nke ọnwa Eprel 2020.
Cheta na Ben Nwoye gweburu BBC Igbo na ọ bụ Geofrey Onyeama, bụ mịnịsta na-ahụ maka mmekọrịta Naịjirịa na mba ndị ọzọ, nyere iwu ka a nwuchie Okugo ma tụọ ya mkpọrọ.

Ebe foto si, Getty Images
Nwoye kwuru na Onyeama boro Okugo ebubo na o ji aha ya agba asịrị na-ekwu na ya bụ Onyeama bu ọrịa coronavirus.
N'oge mbụ anyị na Okugo nwere mkparịtaụka, ọ kpọkuru Onyeisiala Muhammadu Buharị ka o nye aka mee ka atọhapụ Okugo.
Ka otu ụbọchị gachara BBC Igbo dere ya bụ akụkọ, Nwoye ziteere anyị ozi ekele na-ekwu na atọhapụla Okugo.


Onyeama bụ Minista na ahụ maka mba ofesi.
Nwoye sị na ọkaikpe Onyeama bụ Kelechi Onyia ben agwabuola Okugo ya kwugharia ya bụ okwu tupu abalị abụọ agaa.
Mana ha enweghịzị ndidi chere oge ahụ tupu ha jiri ndị uweojii si Abuja bịa kpụrụ ya.
Ọ sị, "Okugo sị na ọbụghi ya kwuru okwu a n'izizi. Na ihe mere bụ na ya hụrụ ka a na-ekwu were jụọ ajụjụ ma ọ bu eziokwu."
Nwoye sị "anyị atụghị anya na Minista ga-eme otu a ebe iwu gbochiri ịkpụrụ mmadụ n'ihe na-enweghị isi n'oge ụgbụa".
Ọ rịọrọ Onyeisiala Muhammadu Buharị ka ọ gbata ọsọ enyemaka mee ka atọhapụ Okugo ozugbo.

Ebe foto si, Getty Images
Ọ sịrị na ọ bụ ndị uweojii si Abuja bịara njem a, ma jụọ "ọ bụ kita onyeisi ndị uweojii sị ka atụghapu mmadu ka a na-ejide mmadụ?"
Ọ sịkwa na ọbụghị na onye ahụ gburu mmadụ maọbụ na o ji egbe gaa ozi.
O kwukwara na ha na Okugo akpaala n'ekwentị kemgbe ọ hapụrụ.
Nwoye sị na ihe kacha atụ ha egwu bụ na-enwere ike ibunye Okugo nje coronavirus mgbe ọ ga-alọta.
Ọ sị, "Onyeama sibu na ya ga-agba akwụkwọ, mana kama o ga-eme nke a akpụrụ nwaamadi a gawa Abuja tinye ya na mkpọrọ. ebe owereike nọrọ bute coronavirus."
BBC Kpọrọ ndị uweojii Engwu steeti mana ha sị na ya bụ nwuchi nwaamadị adịghị ha n'aka.
Nwoye jikwara onyeisiala Buhari maa atụ were sị na eji kwa ya kwuo okwu nke gunyere ị si na ọ nwụọla.
Anyị kpọkwara ọnụ na-ekwuru ndị uweojii na Naịjirịa, Frank Mba bụ onye sị na ya amabeghị ihe gbasara ya. Mana ya ga-achọpụta.
Akara ekwentị Geoffery Onyeama na-akụ mana ọnaghị aza ya.

