You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
Ọkụ ewerela ahịa osisi dị na Legọs tarịe
Ọtụtụ mmadụ na-etu mkpu na soshal midia dịka ọkụ bara ahịa osisi dị na mpaghara Amu dị n'obodo Mushin dị na Legọs steeti n'ụtụtụ a.
Onyeisi ngalaba gbata gbata Bekee kpọrọ Lagos State Emergency Management Agency (Lasema) gwara BBC na ndị ọrụ ya nọ ebe ahụ ịhụ na ọkụ a nyụrụ kpam kpam
Nosa Okunor bụ onye mmekọta ụlọ ọrụ ahụ na ọha si na ya bụ ọkụ malitere na ọnụ ụtụtụ Satọde.
Ọ sịkwa na amabeghị ihe kpatara ya bụ ọkụ.
Mkpu na-adasike dịka ndị mmadụ na-arịọ ka gọọmentị gbata enyemaka.
Oke ịlụ nwaanyi na-ebute ụkpa - Eze Sanusi
Eze Kanụ bụ Muhammad Sanusi nke abụọ sị na ọ bụ nwoke ịlụ ọtụtụ nwaanyị na-ebute oke ogbenye na mpaghara ugwu Naịjirịa.
Eze Sanusi sị na onye anaghị enyenwu otu nwaanyị nrị enweghi ihe okwesiri ịchọ n'ilu nwaanyi ọzọ
N'ofesi,
Agbanyeghị na mba Amerịka kwuru na onweghị onye agha ha nwụrụ site n'ogbunigwe elu mba Iran tụrụ n'ọdọ ndi agha ha n'Iran, ha gbaala ama na ndị agha iri atọ na anọ nwetere mmerụrụ ahụ ụbụrụ na ya.
Ndị agha a merụrụ ahụ a na-anata ọgwụgọ na Amerịka.
A ga-akpụ Salah
Ọgbaa bọọlụ nke Egypt bụ Mohamed Salah ga-esonye na ndị akpụrụ akpụ ha dị n'ụlọ akpụrụ akpụ Madame Tussauds dị na London.
Ọ bụ n'afọ a ka Madame Tussauds ga-ewepụta akpụrụ akpụ Salah n'ụlọ ọrụ ha.