Aston Villa v Man City: Man City ejirila nkata bunye Villa goolu na be ha

Ndí otu Manchester City

Ebe foto si, AFP

Mgbe e biputara ya
Oge e ji agụ akụkọ nkeji 4

Otu Manchester City emeghiri Aston Villa ebere dịka ha ji nkata kponye ha ọkpụ goolu isii.

Villa gbalịrị ịnyeghachi ha mana ha gbanyere naanị otu ọkpụ na ngwụcha asọmpị ahụ.

Mahrez nyere goolu abụọ mbụ na nkeji 18 na 24 ma Aguero so ya n'azụ site na nke o nyere na nkeji 28.

Na oge etinyesoro n'agba nke mbụ, Gabriel Jesus nyere otu ọkpụ na nkeji 46.

Dịka amalitere agba nke abụọ, Aguero nyekwara ọkpụ abụọ ọzọ na nkeji 57 nakwa 81.

Ndị uweojii anwụchiela ụmụ nwoke na-ezu ọbante ụmụnwaanyị

Ọbante ụmụ nwaanyị

Ebe foto si, Nigeria Police

Ndị uweojii na Legọs anwụchiela ụmụ nwoke ise maka ị zuru ọbante ụmụ nwaanyị na gburgburu ebe ha bi n'Ọjọ.

Otu n'ime ha bụ Chukwujaekwu EzeIgbo kwuru na o ruola otu afọ kemgbe ọ na-akpa mkpa mkpa a.

Ndị ahụ a nwụchiri kwuru na ọ bụ ọgwụ ego ka ha ji ọbante ndị a agwọ.

N'aka ọzọ

Ndị Agha Naịjiria

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Ndịagha Naịjirịa ekwuputaghị mmadụ ole nwụrụ na mwakpo a

Ndị agha Naịjirịa ekwuola na atụmatụ ha kpọrọ Handarin Daji ataala isi n dị ohi ruru otu narị na Zamfdara nakwa Katsina steeti.

Ha kwuru na agbagburu ndị a n'ogige ebe ha na-ezo site n'ọnwa Disemba rue ọnwa Jenụwarị afọ a.

Na mba ofesi,

Di Queen dey go church service at Sandringham

Ebe foto si, Reuters

Nkọwa foto, Di Queen attend church service for Sandringham on Sunday morning

Ezenwaanyị mba Briten bụ Elizabeth akpọọla nzụkọ gbatagbata ezinaụlọ ya n'obieze Sandringham iji kpa maka okwu Ọkparaeze Harry na nwunye ya Meghan.

Cheta na ọ bụ abalị ole na ole gara aga ka Harry na nwunye ya Meghan kwuru na ha ga-akwụsitụ ọrụ dịka ndị ezinaụlọ Ezenwaanyị ma malite ịkpata ego nke ha.

N'egwuregwu,

Skip X post, 1
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: Third party content may contain adverts

End of X post, 1

Watford ejirila ọkpụ goolu atọ fọjuo otu Bournemouth ọnụ dịka Aston Villa na Man City na-akwata ya ugbua ịji ma mbe na abọ nke bụ oke n'asọmpị Premier Lig.

Gee nkeji ebe a

Aha nkeananụānụ, Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile
Rob Macaire/Twitter

Ebe foto si, Rob Macaire/Twitter

Nkọwa foto, Ndị nchekwa jichiri Rob Macaire ihe ruru awa atọ

Ndị nchekwa Iran nwụchirị onye nnọchite anya mba Briten bụ Rob Macaire na ebubo na ọ chọrọ ibido ọgba aghara mgbe ọ biara ọgbakọ ịmu anya maka ndị nwụrụ n'ụgbọelu Iran gbaturu.

Kama Macaire si na ọ bụ asị ma sị na ya apụọla tupu ọgbakọ ọha ahụ aghọrọ ngaghari iwe.

O kwuru na ya gara ya bụ imu anya mgbaru maka n'ọbụ ihe ziri ezi ma tinye kwa na ụfodụ ndị nwụru bụ ndị mba Briten.

Skip X post, 2
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: Third party content may contain adverts

End of X post, 2

Ndị mba briten gbarụrụ ihu ma sị na njichi ejichiri onye nnọchite anya ha megidere iwu ụwa niile n'ihi na ekwesighị inwụchi onye nnọchite anya obodo ọbụla.

Ndị nchekwa Iran nwụchịrị ya ma jichie ya ihe ruru awa atọ.

Cheta na Iran ka na-aza ụgba maka ụgbọelu ndị mba Ukraine ha ji ogbunigwe gbatuo.

Maka ọnwụ Chukwuemeka Ike

Chukwuemeka Ike
Nkọwa foto, Ode akwúkwó dere 'Bottled Leopard'

Onyeisiala Naijirịa bụ Muhammadụ Buahrị ezigarala ndị Anambra na ndị ezinaụlo ode Akwụkwọ bụ Chukwuemeka Ike ozi iti aka n'obi maka ọnwụ ya .

Ọ bụ onye ndụmọdụ gọọmentị n'ihe gbasara mgbasa ozi bụ Femi Adesina depụtara nkea ma sị na ọnyeisiala bụ Buharị sị na a ga-echeta Chukwuemeka Ike maka ọrụ ya n'imepe obodo na-ihu na ndị ntotoobia nwetere ezigbo ọzụzụ.

N'Ofesi

Umụakwụkwọ mahadum Amir Kabir pụtara ikwanyere ndị nwụrụ n'ụgbọelu ahụ ụgwụ

Ebe foto si, AFP

Nkọwa foto, Ụmụakwụkwọ mahadum Amir Kabir pụtara ikwanyere ndị nwụrụ n'ụgbọelu ahụ ụgwụ

Otutu ndị mmadụ apụtala n'igwe ha n'isi obodo Iran bụ Tehran ime ngagharị iwe megide ndị ọrụ gọọmentị tubụrụ asị mgbe ha sị na ọbụghị ha gbaturu ụgboelu mba Ukraine.

Ọ bụ na Mahadum abụọ ka emere ngagharị iwe a ebe onyeisiala Amerịka bụ Donald Trump kwadoro ha ma sị na ngaghari iwe ha na akwalite mụọ.

N'Egwuregwu,

Serena Williams

Ebe foto si, Getty Images

Serena Williams onye dị afọ iri atọ na asato ji merịa were mee ya mmerị asọmpị Tenịs nke iri asaa na atọ ya.

Wlliams kwuru na ya ga-enye ego o ritere na mmeria na uwe oyi were zọo asọmpị ahu maka inyere aka maka ọkụ na-agba na mba Ustrelịa.

Ọ ka apụtakwa n'ọgbọ dịka ya na Caroline Woziniacki ga-ezute Asia Muhammad na Taylor Townsend na agba nke ikpeazụ nke mmadụ abụọ.

Jurgen Klopp sị na anya ha dị na iko Premiership

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Jurgen Klopp sị na anya ha dị na iko Premiership

Dịka ndị otu egwu bọọlu liverpool ji otu ọkpu goolu were merie ndi nke tottenham, onye ndụ ha bụ Jurgen Klopp na akowa na na-agbanyeghi na ha ji akara iri na isii were buru eze na Premiership, na ọ naghị aba ha anya tutu ha ebulie iko premiership.