Okorocha's Indictment: 'Onwebeghị ihe ọbụla gọọmenti Ihedioha kwuru maka ebubo eboro Okorocha' - Akwarandu

Rochas na Ihedioha
Mgbe e biputara ya
Oge e ji agụ akụkọ nkeji 2

Maazi Aic Akwarandu bụ onye enyemaka Ihedioha n'ihe banyere ọba mgbasaozi ọhụrụ ekwuola na gọọmentị ihedioha etinyebeghi ọnụ n'ebubo kọmiti nyocha boro Rochas Okorocha.

Maazị Akwarandu sị na ọ bụ akwụkwọ nchoputa ka ya bụ kọmiti wetere.

"Ọ bụ gọọmentị gụcha nchopụta ha o were kpebie ihe ọ ga-eme maka ya site na-iwepụta akwụkwọ Bekee kpọrọ "White Paper".

Cheta na ngalaba nyocha gọvanọ Imo bụ Emeka Ihedioha hibere inyocha nrụrụaka ego n'ụlọ ọrụ akpọrọ "Imo State Oil Producing Area Development Commission" (ISOPADEC) boro Rochas Okorocha ebubo nrụrụka ijeri Naịra isii na ọma.

Mana, ọnụ na-ekwuru Okorocha bụ Sam Onwuemedo si na ọ bụ enweghị ọru tinyere gọọmentị Imo n'ụzọ nnyocha a.

Onwuemedo sị: "O nweghị ihe ọzọ ọ (Ihedioha) na-eme na-abụghị ịlụsa Sịnetọ Rochas Okorocha na ezinaụlọ ya ọgụ. Nke a bụ makana ọ maghị etu esi achi ọchịchị."

"Ya mere chi bụọ Okorocha, chi ejie Okorocha. E hiwela Kọmịtị ruru iri abụọ na atọ. Ihe ndi Kọmịtị ndi a ma bu Okorocha, Okorocha, Okorocha."

"Gọọmentị Imo edela mkpesa nye EFCC, dee nye ICPC, ma nọkwara n'ime ya na ehibe kọmịti."

Maazi Akwarandu gwara BBC Igbo na ọ bụghị eziokwu na onyeisi ya na-achụgharị Okorocha.

Ọ sị: "Ọ bụghị ebubo ka eboro Okorocha. Ọ bụ ihe dị na-akwụkwọ nchọpụta ngalaba nyocha. Ọ ka bụ akwụkwọ nchọpụta enyere Gọọmentị, o nwebeghị ihe gọọmentị kwuru maka ya."

"Gọvanọ enweghi agha ọ na-ebuso Okorocha makana ihe agba n'aka adịghị enyo ya enyo. Kọmiti a so n'ime ndị nke Ihedioha hibere ka ọ banyere n'ọchịchị."

"E nwere nke na-enyocha ọkpuru ọchịchi ime obodo, nwee ndị nke na-enyocha ngalaba dị iche iche.

"Onye mecha nke ya, o wete ya. Onweghi onye Gọvano Ihedioha na-ata amụsụ."

Ọ gakwara n'ihu kwuo na Gọvanọ Ihedioha na-agwa ndị nọ n'ọkwa ugbua na nnyocha na-egosi na ha rituo n'ọkwa, ndi ọzọ enyochakwa ha.

Onwemedo na onwe ya gara n'ihu kwuo na ya bụru na Okorocha were ego, ha gosi ebe o bu ya gawa.

Ọ sị: "Cheta oge ha bịara ọhụru ha sị na Okorocha buru ijeri Naịra iri ise ma maburu ụgbọala ruru 67 kemgbe ahụ o nwebeghi ihe ha kwuru maka ya."

Ọ sị ka ajụọ gọọmentị Imo ebe etinyere ego ha sị na Okorocha buru na ISOPADEC.

"Kpọọnụ aha ebe e buru ego gawa na ndị Naịjirịa nụ ma maa ikpe."

BBC Igbo juburu Rochas Okorocha n'onwe ya ihe o chere maka nnyocha gọọmentị Ihedioha na-enyocha ya na mkparịtaụka e mere n'ọnwa Ọktọba nke 2019.

Lee ihe o kwuru:

Skip Facebook post

Content is not available

View content on FacebookBBC anaghị ahụta maka ọdịnaya nke saịtị ndị dị na mpụga.s

End of Facebook post