Akụkọ dị mkpa tata: Okorocha ewerela ọnọdụ ịzọ ọkwa sinet Imo West
Akụkọ kachasị dị mkpa taa:
Rochas enwetala ikike maka ịzọ ọkwa Sinet Imo West

Ebe foto si, Getty Images
Gọvanọ Imo Steeti bụ Rochas Okorocha enwetela ikike ịzọ ọkwa sinatọ ga-anọchite mpaghara Imo West n'ụlọomeiwu ukwu.
Okorocha ji votu karịrị otu narị puku na iri anọ na otu (141,000) merie Hope Uzodimma.
Bakare sị sị tụnyere onye ga-ahazịgharị Naịjirịa

Ebe foto si, Getty Images
Onye nlekọta ndị ụka Latter Rain Assembly bụ Tunde Bakera adọọla ụmụ Naịjirịa aka na ntị ka ha gbaalịa tinyere onye ebum n'obi ya dịka onyeisala bụ ịhazịgharị ala a.
O kwuru nke a na ihe mmeme akpọrọ "The Road to 2019: Quo Vadis na asụsụ bekee.
N'ofesi, onye ntaakụkọ Saudi-Arabia efuola n'ime embasi ha

Ebe foto si, EPA
N'ofesi, onye ntaakụkọ mba Saụdị Arabia nwere agba efunyụọla anya n' embasi Saudi Arabia dị na Turkey.
Ndị ọrụ gọọmentti mba Turkey na-ekwu na e gburu Jamal Khashoggi n'ime ụlọọrụ mba ha ka ọ gara ịnata akwụkwọ arụkwaghịm nwunye iji nweta ikike ịlụ onye Turkey.
A mara Khashoggi dịka onye na-akatọ ọchịchị mba Saudi Arabia.
N'egwuruegwu, John terry alaala ezumike

Ebe foto si, Getty Images
N'egwuruegwu, John Terry bụ onye gbaburu England nakwa Chelsea alana ezumike nka ka ọgbara afọ iri atọ na asaa.
Terry bụ onye sọgoro mpi afọ iri abụọ na atọ (23) kwuru nke an ọbaozi instagram ya.
Gee nkeji anyị nke tata
Akụkọ ga-amasị gị:































