Akụkọ dị mkpa: APC eyigharịala ntụlịaka imeụlọ nke ndị gọvanọ nke Abia steeti
Akụkọ kachasị dị mkpa taa:
APC Imo eyigharịala ntuliaka imeọlụ ndị gọvanọ

Ndị nọ n' isi nhọpụta na ntuliaka APC mere n' Abịa steeti tata bụ Mọnde kwuru na a ga-ebụgharị ya bụ ntuliaka echi n'elekere isii nke ụtụtụ bụ mgbe a ga-ebubatawa nkwaọrụ e ji eme ya bụ ntuliaka.
Ndị isi APC etiti, ndị ọrụ nhọpụta nakwa ndị ọzọ ọnụ na-erụ n'ọkwụ na patị ahụ kpebiri nke a ụbọchị Monde.
Ihe ọzọ ha kpebiri bụ na a gaghị enwe ndị nọchịte anya nke a kpọrọ "indirect primaries" na bekee.
MASSOB sị APGA enyekwala Bianca ohere

Ebe foto si, Bianca Odumegwu Ojukwu's Facebook
Otu kpọrọ onwe ha MASSOB akpọkuola pati APGA ka ha ghara ịhọpụta Bianca Ojukwu na ndọrọndọrọ ọchịchị maka ịchekwaba ụgwụ na nsọpụrụ Ikemba Igbo ji eje mba.
MASSOB sị na ha achọghị ihe ọbụla ga-emetọ aha Ojukwu.
N'ofesi nwoke amagbuola nwa ya

Ebe foto si, West Midlnads Police
N'ofesi, amaala otu nwoke ikpe maka iji mma magbuo ada ya nwaanyị dị afọ asatọ.
William Billingham ji mma ekwu gbuo ya bụ nwa n'iboro mbọ ihe enyi ya nwaanyị bụ mama nwa ahụ mere ya.
Crystal Palace na Bournemouth ga-akwata tata

Ebe foto si, Getty Images
N'egwuruegwu, che aka ghọrọ asompi ndị Bourmouth na Crystal palace na mgbede a mgbe ọ kụrụ elekere asatọ kpọmkwem.
Gee nkeji anyị nke tata
Akụkọ ga-amasị gị:

































