Hurricane Florence ka na-akpa mkpa mkpa na U.S.
Ipob na ọkwa ịnọ n'ụlọ, kedụ ka ihe siri kwụrụ?

Ebe foto si, Emma Izuchukwu
Oku Ipob kpọrọ maka icheta ndị otu ha lara mmụọ otumgbe a n'afọ gara aga dị ire n'Ọnịcha, Aba, Nnewi mana ọ kpụrụ afọ n'ala n'Enugwu na Ebonyi steeti dịka akụkọ kọrọ.
Ka ọ dị ugbua ndị uweojii na ndị ọrụ nchekwa ndị ọzọ jụrụ eju bara abara n'ọtụtụ ebe n'alaigbo.

Ebe foto si, Getty Images
Gọvanọ ụlọakụ etiti bụ Godwin Emefiele adọọla aka na ntị maka gbanụ gbanụ e ji abadọ atụmatụ iji otu ego na-azụ ahia n'ọdịda anyanwụ mba Afrịka.
Onye nchịkọba West African Monetary Zone bụ Ngozi Egbuna sị na ndị mba ndị ọzọ enwetezụbeghị ihe a tụrụ anya n'aka ha.

Ebe foto si, Reuters
N'ofesi, ndị ọrụ ụlọ nga na mba Briten emela ngagharị iwe maka mmekpeahụ na mmegbu ndị mkpọrọ na-emeso ha.
Mịnịsịta na-ahụ maka ọrụụlọ ndị nga bụ Rory Stewart sị na ya bụ abụbụ ọrụ ndị ọrụ ya gbara megidere iwu obodo ma kwekwa nkwa na a ga-etinye ọnụ na ya bụ okwụ ụbọchị Monday na-abịanụ.

Ebe foto si, Getty Images
Akụkọ kachasị n'ụtụtụ taa
Na mba ofesi

Ebe foto si, Reuters
Ebirimmiri nke a kpọrọ Florence atụọla n'obodo North Carolina na mba Amerịka taa.
Ndị mmadụ gbara ọsọndu nọ n'ọgbọ enyemaka dị icheiche ebe ihe rụrụ ụlọobibi otu puku narị enweghịzị ọkụ latrik.
Na Naịjirịa,

Ebe foto si, Getty Images
Egwu ji ndị mmadụ bi n'ọdịda anyanwụ ugbua maka ihe taa ga-apụta dịka ndị uweojii na-agagharị n'ihe ha kpọrọ ịgosi ike.
Cheta na otu Ipob kpọrọ oku ka ndịgbo nọrọ n'ụlọ iji kwanyere ndị nwụrụ n'egwu eke afọ 2017 ugwu ruru ha.
Ọzọ,
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post, 1

End of X post, 2
Ndị mmadụ gụnyere gọvanọ chiburu Cross River bụ Donald Duke nakwa sinetọ Ben Murray Bruce akatọọla ọkwa onyeisiala nyere Yusuf Magaji Bichi dịka onyeisi ọhụrụ ndị DSS
Mana nwa Bichi a kpọrọ Abba nọ na-ekele ya siite na akara Instagram ya.
N'egwuregwu
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post, 3
Ụmụ afọ Igbo ato esonyela na ndí nkuzi egwuregwu bọọlụ ga-aga emume "World Remit future stars na London" n'ọnwa oktoba
Ha gụnyere Henry Iwuanyanwu, Ezindu Lawrence nakwa Felix Nwosu.
Gee Nkeji nke ụtụtụ a:
Ihe onyonyo