Inec si na-onweghi mgbagwoju anya ọbụla di na bọjeti ha

Mgbe e biputara ya

Akụkọ ndị kachasị mkpa taa:

Inec

Igwe card reader eji eme ntuliaka

Ebe foto si, AFP

Nkọwa foto, Inec na-akwado ntuliaka 2019

Independent electoral commission akpọrọ INEC na aha ịchafụ agọọla na-onweghị ihe nzuzo di na ego ha tinyere maka ntụlịaka 2019.

Ode akwụkwọ mgbasa ozi ha bụ Rotimi Oyekanmi siri na kama, onyeisiala Mohamadu Buharị kere ya bụ ego ezigara ya ụzọ abụọ maka ịwepụta ya.

Okwu Restructing

Igwe Alfred Nnaemeka Achebe bụ obi na ọnisha akpọọla oku ka ndị Igbo tinye ọnụ na ihazigharị obodo Naịjirịa karịa ịzọ ọkwa ọnyeisiala.

O kwuru nke a n'ihụ gọvanọ plateu steti bụ Simon Lalong mgbe ọ gara ịnọnyere ndị Anambra na Jos na-emume ụbọchị omenala ha na ebe ahụ.

Na mba ofesi

GLHF Game Bar Facebook account cover image

Ebe foto si, GLHF Game Bar

Nkọwa foto, Ihe a mere na ọgbọ egwuregwu GLHF Game Bar dị Jacksonville, Florida

Ndị uweojii n'obodo Florida na mba Amerika ekwuola na otu nwoke gburu mmadu abụọ na ebe a na-eme asọmpị ihe nkiri Bekee Kpọrọ Video Game.

Nwoke a mechara gbuo onweya ka ndị hụrụ mgbe ihe a mere na-akọwa na ọ bụ mgbe emeriri ya ka nwoke a kopuru bịa were mgbọ sawa ndi mmadụ ahụ. Ndị merụrụ ahụ nọ ụlọụgwụ.

Na egwuregwu

Ọgbọ egwuregwu Arthur Ashe

Ebe foto si, Reuters

Nkọwa foto, Ọgbọ egwuregwu Arthur Ashe

Ndị ọkwa ha gbagotere na egwuregwu tenis ga-ezute taa na mgba Amerịka maka asọmpị akpọrọ US open na Bekee.

Mmadụ dị ka Andy Murray, Serena Williams, Rafael Nadal, Stan Wawrinka na Sloane Stephens ga eso zụọ iko nke afọ a.

Gere akụkọ mere na mgbede a n'otu nkeji:

Aha nkeananụānụ, Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile

Ihe nkiri nke taa:

Ụkọchukwu Jenny Kenny gwara BBC Igbo na ọ bụ chukwu kpọrọ ya oku, nke mere ya ji jiri egwu agwọ ọrịa.

Aha onyonyo, Achọrọ m ịgụ egwu n'eluigwe - nwaanyị na-agụ egwú n'ahia